Bụrụ Onye Ozi Na-enwe Ọganihu
1 Nna anyị nke eluigwe na-enwe obi ụtọ mgbe ndị ohu ya na-enwe ọganihu ime mmụọ. Nke ahụ pụtara na onye ozi tozuru okè nke na-ekwusa ozi ọma nke ọma ga na-enwe ọganihu. Pọl gbara onye nlekọta bụ́ Timoti ume ka ọ nọgide na-agba mbọ ka ọganihu ya wee nwee ike ịpụta ìhè. (1 Tim. 4:13-15) Anyị niile, ọbụna ndị nkwusa nwere ahụmahụ, kwesịrị ịgba mbọ imeziwanye ozi anyị.
2 Setịpụrụ Onwe Gị Ihe Mgbaru Ọsọ: Onye chọrọ inwe ọganihu ga-enwe ihe mgbaru ọsọ. Olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ anyị nwere ike isetịpụrụ onwe anyị? Anyị nwere ike ịgbalị ijikwu mma agha ime mmụọ anyị, bụ́ Baịbụl, na-eme ihe nke ọma. (Efe. 6:17) O nwere ike inwe akụkụ ozi anyị ọ dị mkpa ka anyị meziwanye, dị ka ịgba àmà n’okporo ụzọ, iji telefon agba àmà, ma ọ bụ ịgba àmà n’ógbè azụmahịa. Anyị nwere ike ịrụ ọrụ iji meziwanye otú anyị si eme nletaghachi. Ihe mgbaru ọsọ ọzọ magburu onwe ya anyị nwere ike isetịpụrụ onwe anyị bụ inwekwu ike ịmalite ọmụmụ Baịbụl na ịnọgide na-eduzi ha.
3 Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka: A haziri ọmụmụ ihe ọgbakọ, karịsịa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi iji nyere anyị aka ito eto dị ka ndị ozi. Ka anyị na-agbalịkwu ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ndị a, ịga ha, na itinye ihe ndị anyị mụtara na ha n’ọrụ, otú ahụ ka uru ndị anyị na-erite ga-ebukwu ibu.—2 Kọr. 9:6.
4 Anyị kwesịkwara inyere ibe anyị aka inwe ọganihu. (Ilu 27:17) Ige ntị nke ọma iji hụ otú ndị anyị na ha na-arụ n’ozi si ezi ozi ọma ga-enyere anyị aka imeziwanye otú anyị si ezi nke anyị. E wezụga nke ahụ, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ anyị nwere ike ime ndokwa ka mmadụ nyere anyị aka. Ọ bụ nnọọ ihe magburu onwe ya onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ inyere anyị aka ịrụpụtakwu ihe n’ozi anyị ma nwetakwuo ọṅụ! È nwere onye ghọrọ onye nkwusa ọhụrụ n’ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ anyị? Anyị nwere ike ịgwa ya ka anyị na ya rụọ n’ozi.
5 Ọrụ kasị mkpa a na-arụ taa bụ ozi Ndị Kraịst. Ka anyị na-achụrụ Jehova “àjà otuto,” anyị kwesịrị inye ya ihe kasị mma anyị nwere. (Hib. 13:15) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike inwe ọganihu n’ozi anyị, anyị ga-abụ ndị ọrụ “na-enweghị ihe [ha] ga-emere ihere, [ndị] na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Tim. 2:15.