Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/02 p. 1
  • Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Onwe Onye Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ndị Ntorobịa—Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Unu?
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Otú Ị Ga-esi Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị I Setịpụụrụ Onwe Gị
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 8/02 p. 1

Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ

1 Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ ịdị na-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi! Iji nyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ, anyị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị anyị pụrụ iru ugbu a ma rụọ ọrụ iji ruo ha. Nke a na-enyere anyị aka iji ume anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. (1 Kọr. 9:26) Olee ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-enwe ike iru?

2 Ọmụmụ Bible: Ị̀ na-akwadebe maka nzukọ ọgbakọ nke ọ bụla? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-ewepụta oge maka ime nnyocha na ịtụgharị uche mgbe ị na-amụ ihe? Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-akwadebe maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche dịịrị izu na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, ihe ị na-eme ọ̀ bụ nanị ịkanye ihe n’azịza ha ka ị̀ na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ma tụgharịa uche n’ihe mere e ji nye nkọwa ndị ahụ e nyere? Ị̀ pụrụ ime ya ihe mgbaru ọsọ gị ime nnyocha n’isi ihe ole na ole kwa izu site n’akụkụ Bible e kenyere ka a gụọ maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ime nnyocha dị otú ahụ n’ihe ime mmụọ na-ewe oge na mgbalị, ma ọ na-eweta ụgwọ ọrụ buru ibu.—Ilu 2:4, 5.

3 Nzukọ Ọgbakọ: Ihe mgbarụ ọsọ ọzọ bụ ịdị na-agachi nzukọ ise nile nke ọgbakọ anya. Ịbịarute n’oge iji soro ndị kwere ekwe ibe anyị nwee mkpakọrịta na ikere òkè n’abụ na ekpere mmeghe na-enye aka ewusi mmụọ nke ọgbakọ ike. Anyị pụkwara ịgbalịsi ike ịza ajụjụ ná nzukọ nke ọ bụla ma rụọ ọrụ iji mee ka azịza anyị na-aka mma. Ikekwe, ị pụrụ igosi otú otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị na paragraf ahụ si emetụta ihe a na-atụle ma ọ bụ ịkọwapụta otú ihe ahụ si emetụta ndụ a na-adị kwa ụbọchị.—Hib. 10:24, 25.

4 Ozi Ubi: Ozi anyị na-aka mma nke ukwuu mgbe anyị setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ. Ì nwere ihe mgbaru ọsọ nke awa ole i mere atụmatụ ịdị na-etinye n’ozi kwa ọnwa? Ụfọdụ achọpụtawo na nke ahụ na-enye aka. Ka ị̀ pụrụ ime ka akụkụ ụfọdụ nke ozi gị ka mma, dị ka iji Bible na-eme ihe n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ime nletaghachi ndị dị irè karị, ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible, ma ọ bụ ịkụzi ihe n’ụzọ dị irè karị n’oge ị na-eduzi ọmụmụ ihe?

5 Ndị mụrụ ụmụ, ùnu na-agba ụmụ unu ume isetịpụ ihe mgbaru ọsọ n’ozi Jehova? Nyerenụ ha aka ịghọta na ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, onye ozi ala ọzọ, ma ọ bụ onye otú nke ezinụlọ Betel bụ ụzọ magburu onwe ha nke isi gosipụta otú ekele ha nwere n’ebe Jehova nọ hà.—Ekli. 12:1.

6 Ka anyị na-atụle ihe ndị anyị na-eme, na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, mgbe ahụ na-arụ ọrụ iji ruo ha, anyị ga na-enweta ọṅụ ka ukwuu n’ozi anyị ma bụrụ ihe agbamume nye ndị ọzọ.—Rom 1:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya