Ndị Kasị Enwe Obi Ụtọ n’Ụwa
1 “Ndị [nwere obi ụtọ, NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha”! (Ọma 144:15) Okwu ndị ahụ na-akọwa Ndịàmà Jehova dị ka ndị kasị nwee obi ụtọ n’ụwa. Ọ dịghị ọṅụ karịrị nke na-abịa site n’ijere nanị otu ezi Chineke ahụ, nke dị ndụ, bụ́ Jehova ozi. Ebe ọ bụ “Chineke onye obi ụtọ,” obi ụtọ ya na-apụta ìhè n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ. (1 Tim. 1:11) Olee akụkụ ụfọdụ nke ofufe anyị ndị na-eme ka anyị nwee obi ụtọ?
2 Ihe Ndị Mere A Ga-eji Na-enwe Obi Ụtọ: Jizọs mesiri anyị obi ike na a na-enweta obi ụtọ site n’ịmara “mkpa nke ime mmụọ [anyị].” (Mat. 5:3) Ịdị na-amụ Bible mgbe nile na ịga nzukọ anyị nile nke Ndị Kraịst na-egbo mkpa ahụ. Ịmata eziokwu nke Okwu Chineke emewo ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ụgha na ihie ụzọ nke okpukpe. (Jọn 8:32) Akwụkwọ Nsọ akụziwokwara anyị ụzọ kasị mma isi na-ebi ndụ. (Aịsa. 48:17) N’ihi nke ahụ, anyị na-enwe mkpakọrịta na-ewuli elu nke Ndị Kraịst n’etiti òtù ụmụnna anyị nwere obi ụtọ.—1 Tesa. 2:19, 20; 1 Pita 2:17.
3 Anyị na-enweta afọ ojuju dị ukwuu site n’irube isi n’ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Chineke, n’ihi na anyị maara na nke a na-echebe anyị ma na-eme ka Jehova nwee obi ụtọ. (Ilu 27:11) Otu onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “N’agbanyeghị ịgbasosi ụkpụrụ ike ha, Ndịàmà Jehova eyighị ndị na-enweghị obi ụtọ. Kama nke ahụ ha na-enwe obi ụtọ. Ndị na-eto eto na ndị toworo eto [n’etiti ha] na-enwe nnọọ ọṅụ pụrụ iche ma bụrụkwa ndị isi zuru nnọọ ókè.” Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka iso anyị na-ekerịta obi ụtọ anyị?
4 Inyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Obi Ụtọ: Ụwa jupụtara n’enweghị obi ụtọ, ndị mmadụ n’ozuzu ha enweghịkwa olileanya maka ọdịnihu. Otú ọ dị, anyị nwere olileanya dị mma, na-amara na otu ụbọchị ihe mwute nile ga-abụ ihe gara aga. (Mkpu. 21:3, 4) Ya mere, anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ozi, na-achọ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị anyị ga-eso kerịta olileanya anyị na ihe ndị anyị kwere banyere Jehova.—Ezik. 9:4.
5 Otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe na-enye afọ ojuju karịa inyere ndị mmadụ aka ịmata Jehova na eziokwu ya.” Ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji gbaa ọtụtụ ndị ọzọ ume ịnakwere ọmụmụ Bible ebe obibi. Ijere Jehova ozi na iwepụta onwe anyị inyere ndị ọzọ aka ijere ya ozi na-arụpụta obi ụtọ kasịnụ.—Ọrụ 20:35.