Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Jona Onye Amụma
1. Olee àgwà ọma ndị Jona nwere?
1 Gịnị na-agbata gị n’obi mgbe ọ bụla i chetara Jona onye amụma? Ụfọdụ nwere ike iche na ọ bụ onye ụjọ ma ọ bụ onye obi tara mmiri. Ma, Jona dị umeala n’obi. O nwere obi ike, ọ chọghịkwa naanị ọdịmma onwe ya. Olee otú anyị ga-esi mụta àgwà ọma ndị a Jona nwere?—Jems 5:10.
2. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị umeala n’obi otú ahụ Jona dị?
2 Ọ Dị Umeala n’Obi: Mgbe Chineke gwara Jona ka ọ gaa dọọ ndị Asiria aka ná ntị, ọ hapụrụ ebe ọ si ya gaa gbara gawa ebe ọzọ. Ihe a o mere ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na obi tara ndị Asiria mmiri. Baịbụl kpọkwara Ninive “obodo na-awụfu ọbara.” (Nehọ. 3:1-3) Ma, Jehova dọrọ Jona aka ná ntị. Mgbe ọ dọchara ya, ya edunye ya Ninive ọzọ. Ọ mụtara ihe n’ihe mere ya gawa ebe Jehova dunyere ya. Nke a na-egosi na ọ dị umeala n’obi. (Ilu 24:32; Jona 3:1-3) O mechara mee ihe Jehova gwara ya n’agbanyeghị na ọ gbara ọsọ mgbe mbụ o dunyere ya ozi. (Mat. 21:28-31) Ọ bụrụ na a dọọ anyị aka ná ntị, ànyị ga-anabata ya otú ahụ Jona si nabata nke ya? Ọ bụrụkwa na ebe anyị na-aga ozi ọma bụ ebe ndị mmadụ na-anaghị achọ iji ntị anụ ozi anyị, ànyị ga-akwụsị ịga ozi ọma n’ebe ahụ?
3. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere obi ike ma anyị gaa ozi ọma? Oleekwa otú anyị ga-esi egosi na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị?
3 O Nwere Obi Ike, Ọ Naghịkwa Achọ Naanị Ọdịmma Onwe Ya: Jona gbaara gawa Tashish kama ịgawa Ninive. Mgbe ọ chọpụtara na ụgbọ mmiri ọ nọ na ya nwere ike ikpu n’ihi ihe ahụ o mere, ọ gwara ndị nọ n’ụgbọ ahụ ka ha tụba ya na mmiri ka ha ghara ịnwụ. (Jona 1:3, 4, 12) Mgbe o mechara gaa ịgwa ndị Ninive ihe Chineke sị ya gwa ha, ọ gara ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ mmadụ n’ihi na ọ chọrọ ka ọtụtụ ndị nụ ihe Jehova gaje ime obodo ahụ. Ihe ndị a o mere gosiri na ọ bụghị onye ụjọ, kama ọ bụ onye amụma obi kara. (Jona 3:3, 4) Olee ihe anyị mụtara n’ihe a o mere? Anyị kwesịrị inwe obi ike mgbe a na-akpagbu anyị n’ihi ozi ọma anyị na-ekwusa. (Ọrụ 4:29, 31) Ọ bụrụkwa na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị, anyị ga-eji oge anyị na ihe ndị anyị nwere na-aga ozi ọma.—Ọrụ 20:24.
4. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara otú ndị amụma si jeere Jehova ozi n’oge ochie?
4 Mgbe ọ bụla ị gụrụ gbasara onye amụma Jehova, ọ ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na i chebara otú o si jee ozi ya echiche. Jụọ onwe gị sị: ‘Olee ihe m gaara eme ma a sị na ọ bụ m ka e dunyere ụdị ozi a? Olee otú m ga-esi na-akpa àgwà ka ya?’ (Hib. 6:11, 12) N’isiokwu ndị ọzọ ga-agba n’Ozi Alaeze Anyị, anyị ga-ahụ ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ndị amụma ndị ọzọ jeere Jehova ozi.