Na-amalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa
A gwara ndị nkwusa na bido n’ọnwa Mee 2011, ha malitewere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa ọ bụla. Ọ bụ ya mere e ji na-ebipụta isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. N’ihi ya, nwanna ga-eduzi nzukọ ozi ubi na Satọdee mbụ n’ọnwa kwesịrị ịtụle otú a ga-esi jiri ihe dị n’isiokwu a malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. A ga-ejikwa ya mee ihe ngosi.
Ndị okenye nwere ike ikpebi ka ìgwè ozi ubi nke ọ bụla na-enwe nzukọ ozi ubi nke ha na Satọdee mbụ n’ọnwa n’ebe ha na-ezukọ. Ha nwekwara ike ikpebi ka ìgwè ozi ubi niile dị n’ọgbakọ ha na-enwekọ ya ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ. N’ebe e nwere ọtụtụ ọgbakọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, o nweghị ọgbakọ kwesịrị iji maka na ha chọrọ ka ìgwè ozi ubi niile dị n’ọgbakọ ha na-enwekọ nzukọ ozi ubi ọnụ bugharịa ụbọchị a pụrụ iche e ji amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.