Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/14 p. 2-4
  • Echefula Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echefula Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha
  • Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Nọ Naanị Ha ma E Chefughị Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2014
km 6/14 p. 2-4

Echefula Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-aga ozi ọma n’ebe a na-elekọta ndị agadi?

1 Nsogbu ya na nká so na-akpa ọtụtụ ndị agadi aka ọjọọ. (Ekli. 12:1-7) N’ihi ya, ndị agadi ụfọdụ nọ n’ebe a na-elekọta ha. Anyị anaghịkwa ahụ ha ma anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ọ na-esikwara anyị ike ịhụ ndị agadi ma ọ bụrụ na ọ bụ na nke ụmụ ha ma ọ bụ ndị ikwu ha ka a na-elekọta ha. N’agbanyeghị na o nwere ike ịna-esiri ha ike ịna-apụ apụ ma ọ bụkwanụ na ha na-echefukarị ihe, ha ka nwere ike ịmụta banyere Jehova, hụkwa ya n’anya. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka ịnụ ozi ọma ga-eme ka ha nwee ‘olileanya nke na-enye obi ụtọ’?—Taị. 2:13.

2. Olee ihe onye nlekọta ije ozi kwesịrị ime?

2 Ihe A Ga-ebu Ụzọ Mee: Ọ bụ onye nlekọta ije ozi kwesịrị ime ndokwa ka ụfọdụ ụmụnna na-aga ozi ọma n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na ha akwadoo nke ọma ma nwee okwukwe na Jehova ga-enyere ha aka, ha nwere ike malite ịmụrụ ụfọdụ n’ime ha ihe.—Ilu 21:5; 1 Jọn 5:14, 15.

3, 4. (a) Ònye ka anyị kwesịrị ịgwa tupu anyị amalite ịmụrụ ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ha ihe? (b) Olee otú anyị ga-esi akọwara ya ihe anyị ga na-eme ma anyị bịa?

3 Ọ bụ otú ebe ahụ dị ga-ekpebi otú a ga-esi na-ezi ozi ọma na ya. Ọ bụrụ ebe e nwere ọtụtụ ndị agadi nakwa ọtụtụ ndị na-elekọta ha, ọ ga-aka mma ka ụmụnna ndị ahụ buru ụzọ gwa onye na-anabata ndị ọbịa na ha chọrọ ịhụ onyeisi ebe ahụ. Ọ bụrụkwanụ ebe e nwere ndị agadi ole na ole na mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ na-elekọta ha, ọ ga-adị mma ka ha gakwuru onye nwe ebe ahụ gwa ya ihe ha ji bịa.

4 Ma ọ̀ bụ onyeisi ebe ahụ ka ụmụnna hụrụ ma ọ̀ bụ onye nwe ebe ahụ, ha kwesịrị ịgwa ya na ihe ha ji bịa bụ ka ha na ndị akụkọ Baịbụl na-amasị nọrịa. Ha ga-ajụ ya ma è nwere ndị a na-elekọta ebe ahụ ga-achọ ka ha na ha jiri ihe dị ka nkeji iri atọ na-ekwu ihe gbasara Baịbụl kwa izu. E nwere akwụkwọ ndị anyị na ha nwere ike ịna-amụ, dị ka akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible nakwa akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. E nwere ike igosi onyeisi ebe ahụ ma ọ bụ onye nwe ebe ahụ akwụkwọ ndị ahụ. Ụmụnna ndị ahụ nwere ike ikwu ụbọchị ha ga na-abịa, oge na ebe ha ga-anọ na-amụ ihe ma ha bịa. Onyeisi ebe ahụ nwekwara ike dee ya n’akwụkwọ mapawa ya n’ebe ndị ọzọ ga na-ahụ ya. Ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ịgwa ya na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ihe ọzọ anyị ga-agwa ya bụ na ọ bụghị okwu Chukwu ka anyị na-abịa ikwu, kama na ọ bụ ịkụziri ha ihe ndị dị na Baịbụl.

5. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka ndị agadi anyị na-amụrụ ihe nwee ike ịna-enwe mmasị n’ihe anyị na-amụrụ ha?

5 Otú A Ga-esi Na-amụrụ Ha Ihe: Otú ebe ahụ dị na ndị anyị na-amụrụ ihe ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-amụrụ ha ihe. N’ihi ya, otú ihe si dịrị ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị na ha ga na-amụ. Anyị kwesịkwara iwetu obi kụziere ha ihe. Anyị gawa ịmụrụ ndị agadi ahụ ihe, anyị ga-achịrị akwụkwọ anyị na ha na-amụ, anyị mụchaa, anyị achịrịkwa ha niile lawa. Ọ bụrụ na akwụkwọ ahụ dị ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo, anyị nwere ike ịchịrị ha gaa ka ụfọdụ n’ime ha na-anaghị ahụcha ụzọ nwee ike iso na-agụ ha. A gụpụta paragraf, a jụọ ajụjụ, a zaa ya. E nwere ike ịgwa ndị nke ma agụ ihe ka ha gụpụta paragraf ma ọ bụkwanụ amaokwu Baịbụl. Anyị kwesịrị ịna-emesapụrụ ha ihu, na-egwusakwa ha egwu ma anyị na ha mụwa ihe. Oge ụfọdụ, anyị nwere ike ịgwa onyeisi ebe ahụ na anyị chọrọ igosi ha vidio anyị. Vidio ahụ nwere ike ịbụ nke na-egosi na Baịbụl bụ Okwu Chineke ma ọ bụ nke na-akọwa akụkọ a kọrọ na Baịbụl. E nwere ike iji ekpere bido ọmụmụ ihe ahụ, jirikwa ekpere mechie ya. E nwekwara ike ịbụ abụ.

6. Gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee onye na-ekwetaghị ihe anyị na-ekwu?

6 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ndị ahụ ekwetaghị ihe anyị gụrụ ma ọ bụ ihe anyị kwuru? Wetuo obi gwa ya okwu. (Kọl. 4:6) Anyị nwere ike gụọrọ ya amaokwu Baịbụl ga-enyere ya aka ịghọta ihe anyị kwuru. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịgwa ya na anyị nụrụ ihe o kwuru nakwa na anyị na ya ga-ekwu banyere ya ma e mechaa.

7. Gịnị ka anyị ga-eme ma otu n’ime ndị agadi ahụ jụọ anyị ajụjụ ma ọ bụ chọọ ka anyị mụwara ya ihe iche?

7 Mgbe ụfọdụ, otu n’ime ha nwere ike jụọ ajụjụ ma ọ bụ chọọ ịmatakwu banyere ihe anyị na ha mụrụ. Ihe otu nwanna nwaanyị na-eme ma a jụọ ya ụdị ajụjụ a bụ ikele onye ahụ ma gwa ya na ha ga-ahụ ma e mechaa. Ọ na-adịkwa mma ka anyị mụwara onye ọ bụla n’ime ndị ahụ ihe ma ọ chọọ ka a mụwara ya ihe iche.

8. Olee otú anyị ga-esi na-agụrụ nletaghachi na ọmụmụ Baịbụl ma anyị gaa n’ebe a na-elekọta ndị agadi?

8 Ọ ga-akacha mma ka ọ bụrụ ụmụnna ndị ahụ na-aga amụrụ ndị agadi ahụ ihe ga na-aga ebe ahụ mgbe ọ bụla. Onye nkwusa ọ bụla so gaa nwere ike ịgụrụ awa. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ahụ agawa n’ihu, nwanna na-amụrụ ha ihe nwere ike ịgụrụ otu nletaghachi mgbe ọ bụla ọ gara. O nwekwara ike ịgụrụ otu ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na e nwere onye nke a na-amụrụ ihe iche, e nwere ike ịgụrụ otu nletaghachi mgbe ọ bụla ọ mụrụ ihe, gụrụkwa otu ọmụmụ Baịbụl n’ọnwa ọ bụla.

9, 10. Olee otú ndị nkwusa na-aga amụrụ ndị agadi ihe n’ebe a na-elekọta ha kwesịrị isi na-emeso ha? Kọwaa.

9 Otú Ọ Ga-esi Na-aga n’Ihu: Ọ na-akacha mma ka onye nkwusa ahụ wepụta otu ụbọchị nakwa oge ọ ga-eji na-amụrụ ndị agadi ahụ ihe. Ha na ndị na-elekọta ha ga-achọ ka ọ na-abịa n’ụbọchị a kara aka. Ha ga-achọkwa ka a na-ebido n’oge, na-emechikwa n’oge. (Mat. 5:37) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ọmụmụ ihe ahụ kpọrọ ihe, haziekwa ya nke ọma. A chọpụtala na ọ ka mma ka ọ bụrụ ndị nkwusa abụọ ka a ga-ekenye ịna-aga amụrụ ndị agadi a ihe. (Ekli. 4:9, 10) Ma, ọ bụrụ ebe ọtụtụ ndị agadi bi, ndị na-aga amụrụ ha ihe nwere ike ịkarị abụọ.

10 Anyị kwesịrị ịna-akpa ndị agadi a nso ka anyị matakwuo ndị ha bụ. (Fil. 2:4) N’ụbọchị mbụ anyị gara, ọ ga-adị mma ka anyị na onye nke ọ bụla n’ime ha kwurịta okwu. Anyị kwesịkwara ịmata aha onye nke ọ bụla, gharakwa ichefu ya. Chetakwa na ndị agadi ụfọdụ anaghị achọ ka onye ha na-amaghị na-akpọ ha aha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-enwere ha ndidi, jirikwa obi ọma na-emeso ha, obi ga-eru ha ala.

11. Olee otú ndị nkwusa ga-esi na-akwanyere ma ndị na-arụ ebe a na-elekọta ndị agadi ma ndị ezinụlọ ndị agadi ahụ ùgwù?

11 Anyị kwesịkwara ịna-akwanyere ma ndị na-arụ ebe ahụ ma ndị ezinụlọ ndị agadi ahụ ùgwù. Ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ahụ agawa n’ihu, ekwesịghị ịgbanwe oge e ji amụ ya ma ọ bụkwanụ otú e si amụ ya n’ebughị ụzọ gwa onyeisi ebe ahụ. Ndị nkwusa ahụ kwesịrị ha nọtụ, ha ajụọ onyeisi ebe ahụ ma ọ̀ na-ahụ aka ọ bụla ọmụmụ ihe ahụ na-enyere ndị agadi ndị ahụ. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ndị agadi ahụ abịa ileta ha mgbe anyị na-amụrụ ha ihe, anyị kwesịrị ịgakwuru ha kelee ha, mee ka ha mara ihe mere anyị na ndị agadi ahụ ji amụ ihe. Anyị kwesịkwara ime ka ha mara na anyị bu ọdịmma ndị agadi ndị ahụ n’obi. Anyị nwekwara ike ịgwa ha ka ha nọrọ ya mgbe anyị na-amụrụ ha ihe.

12, 13. Kọọ ahụmahụ ndị na-egosi na ịga n’ebe a na-elekọta ndị agadi na-amụrụ ha ihe bara uru.

12 Ihe Ọ Rụpụtarala: Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nakwa ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche ekwuola na ịmụrụ ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ha ihe bara uru. Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị mbụ ụmụnna gara n’otu ebe a na-elekọta ndị agadi, ndị ha mụụrụ ihe dị iri abụọ. E mechara mụwara isii n’ime ha ihe iche iche. Otu n’ime ha mechakwara mee baptizim. E nwekwara ebe ọzọ ụmụnna gara mụwara ndị agadi ihe. Ka oge na-aga, otu nwaanyị dị iri afọ asatọ na ise malitere gawa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O mechakwara kwuo na ya chọrọ ime baptizim. N’ebe ọzọ a na-elekọta ndị agadi, onyeisi ebe ahụ hazigharịrị otú ọrụ si aga, mezie ka ụmụnna anyị kwụsị ịbịa na-amụrụ ndị agadi nọ ebe ahụ ihe. Ndị agadi ahụ gakwuuru ya gwa ya na ha chọrọ ka a hapụ ụmụnna anyị ka ha na-amụrụ ha ihe. Ka oge na-aga, a maliteghachiri ọmụmụ ihe ahụ. Ihe dị ka mmadụ iri atọ malitekwara ịbịa ya.

13 Ndị ọzọ na-achọpụtakwa na anyị hụrụ ndị agadi anyị na-amụrụ ihe n’anya. Dị ka ihe atụ, ndị na-arụ ọrụ n’ebe ndị ahụ na-abịa nọdụ ala mgbe ụfọdụ ma a na-amụrụ ndị agadi ahụ ihe. Aka anyị na-enyere ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ha na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọma banyere anyị. (1 Pita 2:12) Dị ka ihe atụ, e nwere ụbọchị a gwara nwoke na-elekọta ebe ndị agadi bi ihe mere anyị ji abịa amụrụ ha ihe. Ya asị: “Gịnị ka unu na-eche kemgbe? Olee mgbe unu ga-ebido?” Onye ọzọ kwukwara sị: “Aga m achọ ka unu na-aga ebe ndị ọzọ a na-elekọta ndị agadi na-amụrụ ha ihe. Ọrụ a Ndịàmà Jehova na-arụ n’anaghị ego bụ otú ha si enyere ndị obodo ha aka.” Otu ebe a na-elekọta ndị agadi na Hawaị nyere ụmụnna anyị asambodo ha ji jaa ha mma maka otú ha si amụrụ ndị agadi nọ n’ebe ahụ ihe.

14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgba mbọ na-enyere ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ha aka?

14 Baịbụl gwara ndị agadi ka ha too aha Jehova. (Ọma 148:12, 13) Ndị agadi nọ n’ebe a na-elekọta ha sokwa ná ndị ahụ Jehova chọrọ ka ha na-eto aha ya. È nwere ebe a na-elekọta ndị agadi n’ókèala unu? Ùnu nwere ike ịga na-amụrụ ha ihe? Ọ bụrụ na ndị okenye ọgbakọ emee ndokwa ndị kwesịrị ekwesị, ndị isi ebe a na-elekọta ndị agadi ana-anabatakwa anyị, anyị ga-enwe ike inyere ndị agadi aka ka ha malite ife Chineke. Ọ bụrụkwa na anyị na-echeta ndị agadi, ọ na-egosi na anyị na-eṅomi Jehova.—Ọma 71:9, 18.

Otú A Ga-esi Na-amụrụ Ndị Agadi Nọ n’Ebe A Na-elekọta Ha Ihe

  • Unu gaa ịmụrụ ha ihe, gwanụ onye na-anabata ndị ọbịa na onyeisi ebe ahụ na unu abịala.

  • Unu bịawa, werenụ akwụkwọ unu na ha na-amụ. Werekwanụ nke ga-ezuru unu. Tinyenụ akwụkwọ ndị ahụ n’akpa dị mma n’anya. Unu mụchaa ihe, unu achịkọkwara ha.

  • Wetuo obi ma unu mụwara ha ihe, na-egwusakwa ha egwu. Na-akpọ ha aha a na-akpọ ha.

  • A gụọ otu paragraf, a kọwaa ya tupu a gụọ ọzọ.

  • Ajụla ha ọtụtụ ajụjụ. Ha zaa ajụjụ, jaa ha mma.

  • Ọ bụrụ na mmadụ ekwetaghị ihe a na-amụ ma ọ bụ jụọ ajụjụ dị iche n’ihe a na-amụ, gwanụ ya na unu ga-aza ajụjụ ya ma e mechaa.

  • Ọ bụrụ na ndị na-arụ ebe ahụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ ndị agadi ahụ ajụọ ajụjụ, zaa ya otú ọ ga-edo ha anya.

  • Ọ bụrụ na e nwere ebe a na-elekọta ndị agadi n’ókèala unu, gbalịanụ na-amụrụ ndị agadi ahụ ihe, ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị na-arụ ebe ahụ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya