Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
1. Olee otú Jizọs si metere ndị ìsì ebere?
1 E nwere ihe mere mgbe ọ fọrọ abalị ole na ole ka e gbuo Jizọs. Ka o si Jeriko na-apụ, ndị ìsì abụọ malitere ịrịọ ya arịrịọ, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere.” N’agbanyeghị na ọ nọ na-eche gbasara ahụhụ ọ ga-ata n’oge na-adịghị anya, ọ kpọrọ ha ma mee ka ha hụwa ụzọ. (Mat. 20:29-34) Olee otú anyị ga-esi na-emetere ndị ìsì ebere otú Jizọs mere?
2. Anyị hụ onye ìsì, olee otú anyị nwere ike isi zie ya ozi ọma?
2 Nyere Ha Aka: Ọ bụrụ na ị hụ onye ìsì, gwa ya onye ị bụ nakwa na ị chọrọ inyere ya aka. O nwere ike ibu ụzọ nyowe gị enyo n’ihi na ndị mmadụ na-arụsakarị ha arụrụala. Ọ bụrụ na ọ chọpụta na ị chọrọ inyere ya aka n’eziokwu, obi ga-eru ya ala. Ụfọdụ ndị ìsì na-ahụtụ ụzọ, ebe ndị ọzọ na-anaghị ahụ ihe ọ bụla. Ụdị ìsì mmadụ kpuru ga-enyere anyị aka ịma ụdị aka anyị ga-enyere ya. I nyechaara ya aka, i nwere ike ịgwa ya na ị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. I nwere ike ịgụrụ ya Abụ Ọma 146:8 ma ọ bụ Aịzaya 35:5, 6. Ọ bụrụ na ọ ma agụ akwụkwọ ndị ìsì, jụọ ya ma ọ̀ ga-achọ ka i wetara ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. I nwekwara ike ịga na jw.org danloduoro ya akwụkwọ na ihe ndị ọzọ a na-egere egere. Ọ bụrụ na kọmputa ya nwere ihe ga na-agụpụtara ya ihe e dere ede, anyị nwere ike isi na jw.org danloduoro ya akwụkwọ anyị ndị dị n’ụdị RTF.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Otú Ị Ga-esi Nyere Onye Ìsì Aka.”
3. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịchọta ndị ìsì n’ókèala anyị?
3 Na-achọ Ndị Ìsì: Anyị anaghị ahụkarị ndị ìsì ma anyị gaa ozi ụlọ n’ụlọ n’ihi na ọ na-esiri ọtụtụ n’ime ha ike ịpụta gwa onye ha na-amaghị okwu. N’ihi ya, ịhụ ha zie ha ozi ọma adịghị mfe. (Mat. 10:11) Ò nwere onye ọrụ unu ma ọ bụ nwa akwụkwọ unu bụ́ onye ìsì? Gakwuru ya zie ya ozi ọma. Ọ bụrụ na e nwere ụlọ akwụkwọ ndị ìsì n’ókèala unu, i nwere ike iwegara ha akwụkwọ anyị e dere maka ndị ìsì ka ha dowe n’ọ́bá akwụkwọ ha. Ọ bụrụ na e nwere onye ị ma onye ezinụlọ ha bụ onye ìsì, gwa ya na Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ìsì Baịbụl nakwa na ị ga-eweta akwụkwọ anyị e dere maka ndị ìsì ma ọ bụ ihe a na-egere egere. Ọ bụrụkwa na e nwere òtù na-enyere ndị ìsì aka ma ọ bụ na e nwere ebe a na-elekọta ndị ìsì n’ókèala unu, gwa onyeisi ha ma ọ bụ onye na-anabata ndị ọbịa otu ihe ahụ. Gwa ha na Chineke ga-eme ka ndị ìsì hụwa ụzọ nakwa na o nweghị onye ga-ekpu ìsì ọzọ n’oge ahụ. I nwekwara ike igosi onye nke ọ bụla n’ime ha vidio dị na jw.org/ig isiokwu ya bụ “Ma Ọ́ Bụghị Ya, M Gaaraghị Ama Ihe M Ga-eme.” Nwoke e gosiri na ya kwuru otú Baịbụl ndị ìsì sirila baara ya uru. Ọ bụrụ na ị kọwaara ha ihe mere i ji bịa, i nwere ike isi n’aka ha nweta ndị ìsì gị na ha ga na-amụ Baịbụl.
4. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Janet mere?
4 Otu nwanna nwaanyị kpuru ìsì aha ya bụ Janet gara n’ebe ndị ìsì bi. Mgbe o ruru, ọ malitere izi otu nwaanyị bi ebe ahụ ozi ọma. Ọ gwara nwaanyị ahụ, sị: “Jizọs mere ka ndị kpuru ìsì hụwa ụzọ iji gosi ihe ọ ga-emere ndị niile kpuru ìsì.” Ha abụọ tụlere ihe dị ná Mkpughe 21:3, 4, Janet agwazie ya otú Alaeze Chineke ga-esi eme ihe ebe ahụ kwuru. Ihe o kwuru riri nwaanyị ahụ ọnụ, ya agwa Janet, sị: “Anụtụbeghị ụdị ihe a n’ọnụ onye ìsì. Ọtụtụ ndị na-ahụ ụzọ na-eche na ihe mere ndị mmadụ ji ekpu ìsì bụ ihe hanwa ma ọ bụ ndị nna nna ha metere.” Janet zigaara nwaanyị ahụ ozi otú ọ ga-esi nweta akwụkwọ Bible Na-akụzi n’Ịntanet. Ha abụọ na-amụzi Baịbụl ugboro abụọ n’izu.
5. N’agbanyeghị na anyị agaghị emeli ka ndị ìsì hụwa ụzọ, olee uru imetere ha ebere ga-aba?
5 Anyị agaghị emeli ka ndị ìsì hụwa ụzọ otú Jizọs mere. Ma, anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ka ha mara Chineke, ma ndị ìsì ma ndị ọzọ Setan merela ka uche ha kpuo ìsì. (2 Kọr. 4:4) Ihe mere Jizọs ji mee ka ụmụ nwoke abụọ ahụ kpuru ìsì hụwa ụzọ bụ na o meteere ha ebere. (Mat. 20:34) Ọ bụrụ na anyị emetere ndị ìsì ebere otú ahụ, anyị ga-enwe ike inyere ụfọdụ n’ime ha aka ịmara Jehova, bụ́ onye ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ikpu ìsì.