AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 52-59
“Tụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị”
E nwere ọtụtụ ọnwụnwa bịaara Devid mgbe ọ nọ ndụ. Mgbe ọ na-ede Abụ Ọma nke 55, ọ taala ọtụtụ ahụhụ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị bịaara ya bụ . . .
Mkparị
Mmegide
Obi Amamikpe
Nsogbu Ezinụlọ
Ọrịa
Mgba Okpuru
Devid gbara mbọ chọta otú ọ ga-esi na-edi nsogbu ya, ọbụnadị mgbe o yiri ka à ga-asị na ọ gaghị edili ya. Ọ na-agwazi ndị niile ha na nsogbu na-alụ ka ha ‘tụkwasị Jehova ibu arọ ha.’
Olee otú anyị ga-esi atụkwasị Jehova ibu arọ anyị?
O nwee ihe ọ bụla na-echegbu gị ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ nsogbu gị, kọọrọ ya Jehova n’ekpere
Kwe ka Chineke jiri Okwu ya na ọgbakọ ya na-eduzi gị
Mee ihe ọ bụla ị ma nwere ike ime ka ihe dịtụ mma, ma ọ bụrụhaala na ihe ahụ emegideghị ihe Baịbụl kwuru