OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Chineke Bụ Onye Na-enyere M Aka”
N’Abụ Ọma nke 52-59, Devid kwuru otú obi dị ya n’oge dị iche iche nsogbu bịaara ya. Ọ tụkwasịrị Jehova obi n’agbanyeghị nsogbu ahụ niile. (Ọma 54:4; 55:22) O tokwara Chineke n’ihi okwu ya. (Ọma 56:10) Ànyị na-agbalị ka anyị nwee ụdị okwukwe na obi ike ahụ Devid nwere? Nsogbu bịara gị, ị̀ na-achọ ka Baịbụl gwa gị ihe ị ga-eme? (Ilu 2:6) Olee amaokwu Baịbụl ndị nyeerela gị aka mgbe . . .
ike gwụrụ gị ma ọ bụ mgbe ị dara mbà?
ị na-arịa ọrịa?
mmadụ kpasuru gị iwe?
a na-emegide gị?