AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 69-73
Ofufe Jehova Na-anụ Ndị Ya Ọkụ n’Obi
Anyị kwesịrị igosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova
Devid ji ịnụ ọkụ n’obi fee Jehova ná ndụ ya niile
Devid agbachighị nkịtị mgbe a na-ama Jehova aka ma ọ bụ na-akọcha aha ya
Ndị torola eto kwesịrị inyere ndị na-eto eto aka ka ha na-anụ ọkụ n’obi
O nwere ike ịbụ Devid dere Abụ Ọma nke 71. O kwuru na ya chọrọ ịkọrọ ndị a ka ga-amụ n’ọdịnihu banyere Jehova
Ndị nne na nna na ndị ọzọ torola eto kwesịrị ịna-akụziri ndị na-eto eto gbasara Jehova
Otú anyị si anụ ọkụ n’obi ga-eme ka anyị na-agwa ndị ọzọ ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ
Amaokwu nke 3—Mmadụ niile ga-adị n’udo
Amaokwu nke 12—A ga-anapụta ndị ogbenye
Amaokwu nke 14—Ime ihe ike ga-akwụsị
Amaokwu nke 16—Nri ga-eju ebe niile