N’Oge A A Na-echeta Ọnwụ Jizọs, Ị̀ Ga-eṅomi Otú Jehova na Jizọs Si Anụ Ọkụ n’Obi?
1. Gịnị ka Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike eme n’oge a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?
1 Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ka nzube ya mezuo. Mgbe Aịzaya 9:7 kwuchara ụfọdụ ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị, ọ sịrị na ọ bụ ‘ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ha.’ Mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi jeere Nna ya ozi. (Jọn 2:13-17; 4:34) N’oge a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọtụtụ nde ndị nkwusa n’ụwa niile na-anụ ọkụ n’obi ka Jehova na Jizọs, ha na-ewepụtakwu oge aga ozi ọma. Ị̀ ga-eme otú a?
2. Gịnị ka ịnụ ọkụ n’obi ga-eme ka anyị malite ime n’abalị asaa n’ọnwa Mach?
2 Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ya: N’afọ a, a ga-ebido na Satọdee, abalị asaa n’ọnwa Mach kpọwa ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Hazie oge gị nke ọma ugbu a ka i nwee ike jiri ịnụ ọkụ n’obi gaa ozi ọma n’oge ahụ. Ọgbakọ dị iche iche ga-enwe obi ụtọ ka ha na-agba mbọ ịgazu ókèala ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Gbalịa kpọọ ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ọrụ ibe gị, ndị ikwu gị, na ụmụ akwụkwọ ibe gị. I nwere ike inye ha akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ gị esi na jw.org gosi ha ebe ga-adị ha nso a ga-anọ eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.
3. Olee otú anyị ga-esi jekwuo ozi n’ọnwa Mach na Eprel?
3 Ịsụ Ụzọ Inyeaka: Ịnụ ọkụ n’obi ga-emekwa ka anyị jekwuo ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. O doro anya na ọtụtụ ndị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach na Eprel n’ihi na ndị ọsụ ụzọ inyeaka nwere ike inye iri awa atọ n’ọnwa abụọ a. Anyị nwere ike tụlee otú anyị ga-esi eme ya ma anyị na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ ma anyị na-amụ ihe n’onwe anyị. (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma, ụmụnna anyị ndị ọzọ ga-emekwa otú ahụ. Ọ bụrụ na ị hapụ ihe ụfọdụ ị gaara eme n’ọnwa ndị ahụ ka i nwee ike ijekwuru Jehova ozi, ọ pụtara na ị na-anụ ọkụ n’obi ka Jizọs.—Mak 6:31-34.
4. Olee uru iji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi n’oge a a ga-echeta ọnwụ Jizọs ga-aba?
4 Jehova na Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi eme ihe ọ bụla ha na-eme. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’oge a a ga-echeta ọnwụ Jizọs, Jehova ga-agọzi anyị. Anyị ga-ezi ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị ozi ọma. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ na anyị na-ejere Jehova ozi, na-enyekwara ndị ọzọ aka. (Ọrụ 20:35) Nke ka nke bụ na obi ga-adị Jehova na Ọkpara ya ụtọ.