AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 119
“Na-eje Ije n’Iwu Jehova”
Ije ije n’iwu Jehova pụtara iji obi anyị niile na-eme ihe ọ chọrọ. E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji obi ha niile mee ihe Jehova chọrọ ma tụkwasị ya obi, otú ahụ Devid mere.
Ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ idebe iwu Chineke
Jọshụa ji obi ya niile tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọ bụla o kwuru. Ọ ma na ọ bụ ime otú ahụ ga-eme ka o nwee obi ụtọ, ihe agaziekwara ya
Okwu Chineke na-enye anyị obi ike anyị ga-eji die ọnwụnwa ndị na-abịara anyị
Jeremaya nwere obi ike ma tụkwasị Jehova obi mgbe ọ nọ ná nsogbu. O biri ndụ dị mfe, ọ hapụghịkwa ozi ya
Ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke nke ọma ga-eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu
Pọl atụghị egwu izi onye ọ bụla ozi ọma. Obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka mgbe ọ katara obi gaa zie Gọvanọ Felix ozi ọma
Olee ebe ndị m chọrọ ịkatakwu obi zie ozi ọma?
N’ụlọ akwụkwọ
N’ebe m na-arụ ọrụ
N’ụlọ anyị
N’ebe ndị ọzọ