Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 3 p. 4-5
  • Onye Kere Anyị Hụrụ Anyị n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Kere Anyị Hụrụ Anyị n’Anya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1. ONYE KERE ANYỊ NA-EME KA ANYANWỤ NA-ACHA
  • 2. ONYE KERE ANYỊ NA-EME KA MMIRI NA-EZO
  • 3. ONYE KERE ANYỊ NA-ENYE ANYỊ NRI NA UWE
  • Kelee Onye Na-enye Mmiri Ozuzo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Na-achọ Alaeze Chineke, Ọ Bụghị Ihe Onwunwe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ịmụ Banyere Ihe Ị Na-apụghị Ịhụ Anya
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 3 p. 4-5
Ebe anwụ na-awa n’ugwu.

Onye Kere Anyị Hụrụ Anyị n’Anya

1. ONYE KERE ANYỊ NA-EME KA ANYANWỤ NA-ACHA

Olee otú i chere ndụ ga-adị n’ụwa a ma á sị na e nweghị anyanwụ? Anyanwụ na-eme ka osisi na-eru akwụkwọ, amị okooko na mkpụrụ. Anyanwụ na-emekwa ka osisi si ná mgbọrọgwụ ya na-amịrị mmiri n’ala gaa n’akwụkwọ ya, mechaa anwụ amịkọrọ ya gaa n’ikuku.

Foto a nọ n’elu see ebe a kụrụ tii n’elu ugwu.

2. ONYE KERE ANYỊ NA-EME KA MMIRI NA-EZO

Mmiri bụ ezigbo onyinye Chineke nyere anyị. Ọ na-eme ka ụwa na-emepụta nri anyị na-eri. Chineke na-enye anyị mmiri ozuzo site n’eluigwe. Ọ na-enyekwa anyị mkpụrụ n’oge mkpụrụ ji amị, na-enye anyị nri, na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.

Ebe nnụnụ be n’elu osisi chọọ ka ọ kpụrụ mkpụrụ osisi na-ada ada.

3. ONYE KERE ANYỊ NA-ENYE ANYỊ NRI NA UWE

Ọtụtụ ndị bụ́ nna na-echegbu onwe ha gbasara nri ndị ezinụlọ ha ga-eri na uwe ha ga-eyi. Ma, Baịbụl gwara anyị sị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghị aghọrọ mkpụrụ, ha adịghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa ha?”​—Matiu 6:​25, 26.

“Mụtanụ ihe site n’okooko lili dị n’ọhịa, otú ha si eto . . . ; ma ana m asị unu na ọbụna [Eze] Sọlọmọn, n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha. Ma ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe . . . , ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị?”​—Matiu 6:​28-30.

Ebe ọ bụ na Chineke na-enye anyị nri na uwe, o doro anya na ọ ga-enyekwara anyị aka inweta ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Ọ bụrụ na anyị ana-eme uche Chineke, ọ ga-agọzi mbọ anyị na-agba ịkọ nri. O nwekwara ike inyere anyị aka ịchọta ọrụ ka anyị nwee ike ịna-azụta ihe ndị dị anyị mkpa.​—Matiu 6:​32, 33.

N’eziokwu, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịhụ Chineke n’anya ma anyị tụlee ihe gbasara anyanwụ, mmiri ozuzo, ụmụ nnụnụ, na okooko osisi. Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú Onye kere anyị si na-agwa anyị okwu.

Onye kere anyị ‘na-eme ka anyanwụ ya na-awa, na-emekwa ka mmiri na-ezo.’​—MATIU 5:45.

Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ihe gbasara anyị na-emetụkwa ya n’obi. Ọ na-elekọta anyị nke ọma otú ahụ ezigbo nna si eme. Akwụkwọ Nsọ kwuru na Chineke na-eji obi ya niile enye anyị ihe n’ihi na ọ ‘maara ihe ndị na-akpa anyị tupu anyị arịọ ya.’​—Matiu 6:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya