Ebe otu nwanna nwaanyị wepụtara oge na-amụ Baịbụl ma na-atụgharị uche
Ihe I Nwere Ike Ikwu
TETA!
Ajụjụ: Baịbụl ọ̀ bụ akwụkwọ si n’aka Chineke? Ka ọ̀ bụ uche ụmụ mmadụ ka e dere na ya?
Amaokwu Baịbụl: 2 Tim. 3:16
Otú a ga-esi enye ya: Teta! a, kwuru ụzọ ihe atọ gosiri na Baịbụl si n’aka Chineke n’eziokwu.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndụ Chineke nyere anyị anya?
Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 4:11
Eziokwu: Ebe ọ bụ na ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke, anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe. Anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ihe ọghọm. Anyị ekwesịghịkwa ịkpachara anya mee ihe ga-ewepụ ndụ mmadụ. Anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe.
GỊNỊ GA-EME KA UNU NA-ENWE OBI ỤTỌ N’ỤLỌ UNU?
Ajụjụ: Legodị ajụjụ dị n’ihu traktị a, leekwa azịza ụfọdụ dị ná mgbada ya. Olee ihe i nwere ikwu gbasara ya?
Amaokwu Baịbụl: Luk 11:28
Otú a ga-esi enye ya: Traktị a kọwara uru ime ihe a Chineke kwuru ga-abara ezinụlọ gị, na ihe mere i kwesịrị iji kwere ihe Baịbụl kwuru.
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.