Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb17 Jun p. 8
  • Ka Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ Gị Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ Gị Ụtọ
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Werenụ Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi”
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ọṅụ Bụ Àgwà Chineke Na-eme Ka Anyị Nwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
mwb17 Jun p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ka Ikwusa Ozi Ọma Na-atọ Gị Ụtọ

Ò nwetụla mgbe o siiri gị ike ikwusa ozi ọma? Ọtụtụ n’ime anyị ga-asị na o nwetụla. Gịnị kpatara ya? O nwere ike ịbụ n’ihi ịkpọasị ma ọ bụ mmegide, ma ọ bụkwanụ na ụjọ ịgwa ndị anyị na-amaghị okwu na-atụ anyị. N’eziokwu, ihe ndị a nwere ike ime ka obi ụtọ anyị laa. Ma, anyị na-efe Chineke obi ụtọ, onye chọkwara ka anyị jiri obi ụtọ na-ejere ya ozi. (Ọma 100:2; 1 Tim. 1:11) Olee ihe atọ mere ikwusa ozi ọma kwesịrị iji na-atọ anyị ụtọ?

Nke mbụ bụ na anyị na-ezisa ozi na-eme ka e nwee olileanya. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị enweghịzi olileanya taa, ma anyị nwere ike izi ndị mmadụ “ozi ọma nke ihe ka mma.” (Aịza. 52:⁠7) Ozi ọma Alaeze Chineke nwekwara ike ime ka anyịnwa na-enwe obi ụtọ. Tupu gị agawa ozi ọma, buru ụzọ chee echiche banyere ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-ewetara anyị n’ụwa a.

Nke abụọ bụ na ozi ọma anyị na-ekwusa na-abara ndị mmadụ ọtụtụ uru. Ọ na-eme ka ha kwụsị àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa ma nwezie olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Aịza. 48:​17, 18; Rom 1:16) Anyị nwere ike iwere onwe anyị ka ndị ọrụ ha bụ ịzọ ndị mmadụ ndụ. Ọ bụrụgodị na ndị ụfọdụ achọghị ka a zọọ ha ndụ, anyị ka ga na-achọkwa ndị chọrọ.​—⁠Mat. 10:​11-14.

Nke atọ, bụ́kwanụ nke kacha mkpa, bụ na ozi ọma anyị na-ewetara Jehova nsọpụrụ. O jighị ozi ọma anyị na-ezi egwu egwu. (Aịza. 43:10; Hib. 6:10) Ihe ọzọ bụ na ọ na-enye anyị mmụọ nsọ ya iji rụzuo ọrụ a. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o mee ka ị na-enwe ọṅụ, bụ́ ihe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Jehova ga-enyere anyị aka imeri ihe ndị na-echegbu anyị. Anyị ejirizie obi ike na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 4:31) N’agbanyeghị otú ndị mmadụ si akpaso anyị àgwà, ozi ọma anyị ga na-atọ anyị ụtọ.​—⁠Ezik. 3:⁠3.

Otú dị iche iche obi nwere ike ịdị mmadụ n’ozi ọma​—⁠obi ọjọọ na obi ụtọ

Olee otú ị chọrọ ka obi na-adị gị ma ị nọrọ n’ozi ọma? Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-enwe ọṅụ?

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỊMỤ IHE NA ỊTỤGHARỊ UCHE N’IHE Ị NA-AMỤ GA-EMELI KA I NWEWE ỌṄỤ ỌZỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A NA-ESONỤ:

  • Olee ihe mere ọmụmụ ihe onwe onye kwesịrị iji dị anyị ezigbo mkpa, ọ sọgodị ya ya bụrụ na anyị na-eji ọtụtụ awa aga ozi ọma?

  • Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’aka Meri?

  • Olee mgbe i ji ewepụta ohere atụgharị uche n’Okwu Chineke?

  • Olee ihe na-eme gị obi ụtọ ma ị nọrọ n’ozi ọma?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya