“Werenụ Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi”
1. Olee ebe ndị ohu Jehova pụrụ isi nweta ọṅụ dị ukwuu?
1 “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe nile n’ime Onyenwe anyị,” ka Pọl onyeozi dere. “Ọzọkwa aga m asị, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!” (Fil. 4:4) Ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma ahụ na inyere ndị yiri atụrụ aka ife Jehova ofufe bụ ihe na-enye ọṅụ dị ukwuu. (Luk 10:17; Ọrụ 15:3; 1 Tesa. 2:19) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị achọpụta mgbe ụfọdụ na anyị enweghị ọṅụ n’ozi anyị, gịnị ka anyị pụrụ ime?
2. Olee otú ịtụkwasị uche n’ebe onye nyere anyị ọrụ nọ pụrụ isi mee ka anyị na-enwe ọṅụ?
2 Ọrụ Chineke Nyere: Cheta na ọrụ nkwusa anyị si n’aka Jehova. Ee, lee ihe ùgwù anyị nwere ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” n’ikwusa ozi Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ! (1 Kọr. 3:9) Kraịst Jizọs nọnyeere anyị n’ọrụ a a na-agaghị arụghachi ma ọlị. (Mat. 28:18-20) Ndị mmụọ ozi na-ekerekwa òkè dị ukwuu ma na-eso anyị arụkọ ọrụ ná nnukwu owuwe ihe ubi ime mmụọ nke na-aga n’ihu ugbu a. (Ọrụ 8:26; Mkpu. 14:6) Akwụkwọ Nsọ, tinyere ahụmahụ dị iche iche nke ndị Chineke na-enwe, na-enye ihe àmà doro anya na Jehova na-akwado ọrụ a. N’ihi ya, mgbe anyị na-eme nkwusa, anyị na-aga “dị ka ndị e si n’ebe Chineke nọ zipụ, n’ihu anya Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.” (2 Kọr. 2:17) Lee ka nke a si bụrụ ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji nwee ọṅụ!
3. Ọrụ dị aṅaa ka ekpere na-arụ n’ime ka anyị nọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Chineke?
3 Ekpere dị anyị nnọọ mkpa maka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Chineke. (Gal. 5:22) Ebe ọ bụ nanị site n’ike Chineke ka anyị pụrụ ịrụ ọrụ ya, ọ dị anyị mkpa ịrịọsi ya arịrịọ ike maka mmụọ ya, bụ́ nke ọ na-eji mmesapụ aka enye ndị na-arịọ ya. (Luk 11:13; 2 Kọr. 4:1, 7; Efe. 6:18-20) Ikpe ekpere banyere ozi anyị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi mgbe a na-anabataghị anyị nke ọma. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike iji obi ike na ihu ọchị nọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 4:29-31; 5:40-42; 13:50-52.
4. Olee otú ime ezi nkwadebe na-esi enye aka n’ịmụba ọṅụ anyị na-enwe n’ime nkwusa, oleekwa ụzọ ụfọdụ ndị dị irè anyị pụrụ isi mee nkwadebe?
4 Kwadebe nke Ọma: Ụzọ dị irè isi mụbaa ọṅụ anyị na-enwe mgbe anyị na-ekere ókè n’ozi bụ site n’ịkwadebe nke ọma. (1 Pita 3:15) Ọ dịghị mkpa na nkwadebe dị otú ahụ ga-ewe oge dị ukwuu. Ọ na-ewe nanị minit ole na ole iji tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ nke a tụrụ aro ya maka inyefe magazin ndị ọhụrụ, ma ọ bụ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke kwesịrị ekwesị maka akwụkwọ ị chọrọ inyefe. Maka okwu mmeghe kwesịrị ekwesị, ị pụrụ ịgụ akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible ma ọ bụ mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị gara aga. Ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze na-ahụ ya dị ka ihe na-enye aka idetu ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị mkpirikpi ná mpempe akwụkwọ. Site n’oge ruo n’oge, ha na-atụleghachi ihe ha dere ná mpempe akwụkwọ ahụ iji ghara ichefu ihe ha ga-ekwu. Nke a na-enye aka mee ka ahụ́ kwụsị ịma ha jijiji ma na-eme ka obi sie ha ike iji nkwuwa okwu na-eme nkwusa.
5. Olee otú ọṅụ si abara anyị na ndị ọzọ uru?
5 Ọṅụ na-eweta ọtụtụ abamuru. Ihu ọchị na-eme ka ozi anyị na-amasịkwu ndị mmadụ. Ọṅụ na-ewusikwu anyị ike ịtachi obi. (Neh. 8:10; Hib. 12:2) Karịsịa, ozi anyị ji ọṅụ na-eje na-enye Jehova otuto. N’ihi ya, ka anyị ‘were ọṅụ na-ejere Jehova ozi.’—Ọma 100:2.