Mụbaa Ọṅụ Gị n’Ime Nkwusa
1 Ọṅụ nke izisa ozi ọma ahụ—ị̀ na-enweta ya n’ozi gị? Ọ bụrụ na anyị elezighị anya, ajọ ụwa gbara anyị gburugburu pụrụ ime ka anyị na-atụ ụjọ ime nkwusa, na-eme ka ọṅụ anyị funahụ anyị. Ịrụ ọrụ n’ókèala ndị mmadụ na-adịghị ege ntị pụkwara ime ka anyị nwee nkụda mmụọ. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa bara uru ka anyị pụrụ iwere iji mụbaa ọṅụ anyị n’ime nkwusa?
2 Nwee Nchekwube: Inwe nchekwube na-enye aka n’ezie. Otu ụzọ isi mee nke ahụ bụ site n’ịtụgharị uche n’ihe ùgwù anyị pụrụ iche nke ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Jizọs na-anọnyekwara anyị n’ịrụzu ọrụ a. (Mat. 28:20) O jikwa usuu ndị mmụọ ozi akwado anyị. (Mat. 13:41, 49) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe mmesi obi ike na mgbalị anyị bụ nke Chineke na-eduzi. (Mkpu. 14:6, 7) Ya mere, n’agbanyeghị otú ụfọdụ ụmụ mmadụ pụrụ isi meghachi omume n’ebe ọrụ anyị dị, mmeghachi omume a na-enwe n’eluigwe bụ nke oké ịṅụrị ọṅụ!
3 Kwadebe nke Ọma: Ime ezi nkwadebe na-etinyekwa ihe n’ọṅụ anyị. Ịkwadebe maka ozi adịghị mkpa na ọ ga-agụnyerịrị ọtụtụ ọrụ. Ọ na-ewe nanị minit ole na ole iji tụlee ihe a ga-ekwu site na magazin ma ọ bụ akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’ọnwa. Họrọ otu ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ site n’akụkụ bụ́ “Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ,” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee ihe ntinye nke January 2002, “Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ n’Ozi Ubi Bụ́ Ndị A Tụrụ Aro Ha,” ma ọ bụ tụlee akwụkwọ Reasoning maka okwu mmalite dị irè. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ ejiri okwu mgbochi ha na-ewelitekarị mee ihe, kwadebe nzaghachi ndị ga-aza ihe ha kwuru ma lekwasị anya n’isiokwu na-akpali mmasị. Akwụkwọ Reasoning na-enye aka n’ime nke a. Iji ihe inyeaka ndị a eme ihe ga-enye anyị obi ike dị anyị mkpa iji jiri ọṅụ na-eme nkwusa.
4 Kpesie Ekpere Ike: Ekpere dị oké mkpa maka inwe ọṅụ na-adịgide adịgide. Ebe ọ bụ na anyị na-arụ ọrụ Jehova, ọ dị anyị mkpa ịrịọ ya maka mmụọ ya, nke otu n’ime mkpụrụ ya bụ ọṅụ. (Gal. 5:22) Jehova ga-enye anyị ume ịnọgide na-eme nkwusa. (Fil. 4:13) Ikpe ekpere maka ozi anyị pụrụ inyere anyị aka ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị nwetara ahụmahụ ndị na-adịghị mma. (Ọrụ 13:52; 1 Pita 4:13, 14) Ọ bụrụ na e menye anyị ụjọ, ekpere pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe obi ike na obi ụtọ.—Ọrụ 4:31.
5 Meghee Ohere Dị Iche Iche: N’ezie, ozi anyị na-enye ọṅụ karị mgbe anyị nwere ike inweta ndị mmadụ ma gbaara ha àmà. Ịgbanwe usoro ihe omume gị iji gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’oge awa dị iche, ikekwe n’ehihie ma ọ bụ n’uhuruchi, pụrụ ime ka e nwekwuo ihe ịga nke ọma. Ị na-ezute ndị mmadụ mgbe ọ bụla ị na-aga ije n’okporo ámá, mgbe ị na-azụ ahịa, mgbe ị nọ na bọs, ma ọ bụ mgbe ị na-aga n’ebe ntụrụndụ. Gịnị ma ị kwadebe okwu dị mkpirikpi e ji amalite nkwurịta okwu ma bute ụzọ n’ijekwuru ndị yiri ka hà nwere omume enyi? Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị na-arụ ọrụ ego ma ọ bụ na-aga ụlọ akwụkwọ ọha, bụ́ ebe gị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu kwa ụbọchị. Ị pụrụ inweta ohere ịgba àmà site nanị n’iwelite otu isiokwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke na-akpali mmasị. A na-achọta aro ndị dị mma na peeji nke mbụ nke ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke January 2002. Nke ọ bụla n’ime aro ndị ahụ pụrụ ịmụba n’ụzọ dị ukwuu ọṅụ mmadụ na-enwe n’ime nkwusa.
6 Ebe ọ bụ na ọṅụ na-enyere anyị aka ịtachi obi, lee mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe ya! Site n’ime otú ahụ, anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu mgbe ọrụ a a na-agaghị arụghachi ma ọlị bịara ná njedebe. Atụmanya ahụ n’onwe ya pụrụ ịmụba ọṅụ anyị n’ime nkwusa.—Mat. 25:21.