AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 32-34
Nnukwu Ọrụ Dịịrị Onye Nche
Ndị nche obodo na-anọkarị n’elu mgbidi ma ọ bụ n’ụlọ nche na-elepụ anya iji gbaa àmà maka ọdachi na-abịanụ. Jehova họpụtara Ezikiel ka ọ bụrụ “onye nche ụlọ Izrel.”
Ezikiel gwara ụmụ Izrel na mbibi ga-abịakwasị ha ma ọ bụrụ na ha ahapụghị ihe ọjọọ ha na-eme
Olee ozi Jehova gwara anyị ziwe ndị mmadụ taa?
Aka ná ntị a Ezikiel dọrọ ha ga-eme ka a zọpụta ma hanwa ma yanwa
Olee ihe ndị ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Jehova dunyere anyị?