Ebe otu nwanna na-enye mmadụ traktị Ga-adị Ndụ Ọzọ na Tuvalu
Ihe I Nwere Ike Ikwu
TETA!
Ajụjụ: Gịnị mere o ji dị mma ịkwadebe maka ọdachi?
Amaokwu Baịbụl: Ilu 27:12
Akwụkwọ: Teta! a kwuru gbasara ihe anyị kwesịrị ime tupu ọdachi emee, mgbe ọ na-eme nakwa mgbe o mechara.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Olee otú anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?
Amaokwu Baịbụl: 1 Jọn 5:3
Eziokwu: Anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ya isi.
NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊ NDỤ ỌZỌ? (T-35)
Ajụjụ: Kwa afọ, ọtụtụ ndị mmadụ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-eme ememme iji cheta ndị nwụrụ anwụ. Olileanya ọ̀ dị na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?
Amaokwu Baịbụl: Ọrụ 24:15
Akwụkwọ: Traktị a kwuru gbasara uru olileanya mbilite n’ọnwụ ga-abara anyị. [O kwe mee, kpọnyere ya vidio bụ́ Olileanya Ọ̀ Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?]
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.