OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ihe Anyị Ga-amụta n’Akwụkwọ Jona
Jehova mere ka e dee akụkọ gbasara ọtụtụ ndị ohu ya ndị nwoke na ndị nwaanyị na Baịbụl, ka anyị si na ha mụta ihe. (Rom 15:4) Olee ihe ndị ị mụtara n’akwụkwọ Jona? Leenụ vidio bụ́ Ofufe Ezinụlọ: Jona Mụtara Ihe n’Ebere Jehova, zaakwanụ ajụjụ ndị a:
Olee nsogbu bịaara ndị nkwusa atọ e gosiri na vidio a?
Olee otú akwụkwọ Jona ga-esi gbaa anyị ume ma a dọọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ napụ anyị ihe ùgwù anyị nwere n’ọgbakọ? (1 Sam. 16:7; Jona 3:1, 2)
Olee otú akụkọ Jona ga-esi nyere anyị aka iji obi ụtọ na-eje ozi n’ókèala anyị? (Jona 4:11; Mat. 5:7)
Olee otú ihe mere Jona ga-esi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị arịawa ọrịa na-anaghị ala ala? (Jona 2:1, 2, 7, 9)
Gịnị ka ị mụtara na vidio a gbasara uru ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na-aba?