AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAỊKA 1-7
Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Anyị?
Jehova maara ebe ike anyị ruru. O nwetụdịghị mgbe ọ na-atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. N’anya Chineke, mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị dị ezigbo mkpa n’ofufe anyị na-efe ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova na-anabata ofufe anyị, anyị ga na-egosi ụmụnna anyị ịhụnanya ma na-akwanyekwara ha ùgwù.