AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 17-18
Na-ekele Onye Meere Gị Ihe
Olee ihe akụkọ a na-akụziri anyị gbasara ikele onye meere anyị ihe?
Ọ bụghị naanị na obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ ma mmadụ meere anyị ihe, anyị kwesịkwara ikele onye ahụ
Anyị jiri obi anyị niile kelee onye meere anyị ihe, ọ na-egosi na anyị nwere àgwà ọma, na-egosikwa na anyị hụrụ onye ahụ n’anya
Ndị niile chọrọ ime ihe dị Kraịst mma kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, na-ekelekwa onye ọ bụla meere ha ihe ọma n’agbanyeghị ebe onye ahụ si ma ọ bụ okpukpe onye ahụ na-ekpe