OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Cheta Nwunye Lọt
Gịnị mere nwunye Lọt ji lee anya n’azụ mgbe o si Sọdọm na-agbapụ? Baịbụl agwaghị anyị. (Jen. 19:17, 26) Ma, amaokwu ndị gbara ihe ahụ Jizọs kwuru gburugburu gosiri na o nwere ike ịbụ na o chewere gbasara ihe ndị ọ hapụrụ na Sọdọm. (Luk 17:31, 32) Olee otú anyị ga-esi zere ime ka nwunye Lọt, ghara ime ihe ga-emebi adịm ná mma anyị na Chineke? Anyị ekwesịghị ikwe ka ịchụ ihe onwunwe bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. (Mat. 6:33) Jizọs sịrị na anyị “apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Ma, ọ bụrụkwanụ na anyị achọpụta na ịchụ ihe onwunwe na-emezi ka anyị ghara iji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta ebe ndị anyị kwesịrị imezitụ ihe, rịọkwa ya ka o nye anyị obi ike na ume iji mezie ha.
LEE MA Ị GA-ECHETA IHE E MERE NA VIDIO BỤ́ CHETA NWUNYE LỌT MA ZAA AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee otú m ga-esi gosi na m ‘na-echeta nwunye Lọt’?
Olee otú nsogbu a na-enye Gloria ka ọ kpatakwuo ego si kpaa ya aka ọjọọ, ma n’otú o si eche echiche, otú o si ekwu okwu, nakwa n’ihe ndị ọ na-eme?
Olee ihe e ji ihe mere nwunye Lọt na-akụziri anyị taa?
Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru si nyere Joe na ezinụlọ ya aka?
Olee otú ndị ha na Anna na-akpa n’ụlọ ọrụ ha si chọọ idufu ya?
Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike ma ọ bụrụ na a na-enye anyị nsogbu ime ka ịchụ ego bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ?
Olee otú Brian na Gloria si maliteghachi ime ka ihe gbasara ofufe Chineke bụrụ ihe kacha ha mkpa?
Olee ihe ndị Baịbụl kwuru na-abara anyị uru ị chọpụtara mgbe ị na-ele vidio a?