OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú E Si Mee Ka Ozi Ọma Anyị Bụrụ nke Iwu Kwadoro na Kwebek
Mgbe a na-ekpe Pọl ikpe, ọ kpọkuru Siza. Ọ kpọkuru Siza n’ihi na ọ bụ nwa amaala Rom. Anyị nwekwara ike ime otu ihe ahụ taa. Leenụ vidio bụ́ Otú E Si Mee Ka Ozi Ọma Anyị Bụrụ nke Iwu Kwadoro na Kwebek, ma hụ otú ụmụnna anyị si jiri iwu gbachitere ozi ọma anyị na Kwebek. Zaakwanụ ajụjụ ndị a:
Olee nsogbu ndị ụmụnna anyị nọ na ya na Kwebek?
Gịnị bụ aha traktị pụrụ iche ha kesara, oleekwa ihe ọ kpatara?
Gịnị mere Nwanna Aimé Boucher?
Gịnị ka Ụlọikpe Kasị Elu kpebiri n’ikpe Nwanna Boucher?
Olee ihe ụmụnna anyị rịọrọ ka Ụlọikpe Kacha Elu mee mgbe ha hụrụ na ihe esiela ike, gịnị sikwa na ya pụta?
Gịnị mechara mee mgbe ndị ụkọchukwu dunyere ndị uwe ojii ha agaa kwụsị ọmụmụ ihe ụmụnna anyị nọ na-enwe?