Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Febụwarị p. 3
  • Ị̀ Na-ahụ Àgwà Ndị A Na-apughị Ịhụ Anya Chineke Nwere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ahụ Àgwà Ndị A Na-apughị Ịhụ Anya Chineke Nwere?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke Dị
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jiri Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Ụmụ Gị Gbasara Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Otú Ihe Ndị Jehova Kere Si Egosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Febụwarị p. 3

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-ahụ Àgwà Ndị A Na-apughị Ịhụ Anya Chineke Nwere?

Mgbe ọ bụla ị hụrụ okoko osisi mara mma, kpakpando ndị dị ná mbara ígwé na ụda mmiri si n’ugwu na-asọda, ọ̀ naghị eme ka icheta na ha bụ ọrụ aka Chineke? Ihe ndị e kere eke dị gburugburu anyị na-eme ka anyị hụ àgwà ndị a na-apụghị ịhụ anya Jehova nwere. (Rom 1:20) Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe ndị e kere eke anyị na-ahụ, anyị ga-ahụ ike Chineke, ịhụnanya ya, amamihe ya, ikpe ziri ezi ya nakwa mmesapụ aka ya.​—Ọma 104:24.

Olee ihe ụfọdụ Jehova kere ị na-ahụ kwa ụbọchị? Ọ bụrụgodị na i bi n’obodo mepere emepe, ị ka nwere ike ịna-ahụ ụmụ nnụnụ na osisi dị iche iche. Ileru ihe ndị Jehova kere eke anya nwere ike inyere anyị aka ibelata nchegbu na ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa. O nwekwara ike ime ka obi sie ike na Jehova ga-elekọtali anyị ruo mgbe ebighi ebi. (Mat. 6:​25-32) Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka, nyere ha aka ka ha hụ àgwà ndị magburu onwe ya Jehova nwere. Ka anyị na-amụtakwu gbasara ihe ndị Jehova kere, anyị ga-abịarukwu ya nso.​—Ọma 8:​3, 4.

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ DỊ ỊTỤNANYA CHINEKE KERE NA-EME KA A HỤ EBUBE YA​—ÌHÈ NA ỤCHA DỊ ICHE ICHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị na-enyere anyị aka ịhụ ụcha dị iche iche?

  • Gịnị mere o ji adị ka ụcha ihe ụfọdụ ọ na-agbanwe agbanwe?

  • Olee ihe mere anyi ji ahụ ụcha dị iche iche ná mbara ígwé?

  • Olee ụfọdụ ụcha ndị mara ezigbo mma ị na-ahụ n’ihe ndị e kere eke dị gburugburu ebe i bi?

  • Gịnị mere anyị kwesiri iji na-ewepụta oge eleru ihe ndị Chineke kere anya?

Okoko osisi na-acha pịnk pịnk, urukurubụba na-acha anụnụ anụnụ, mkpụrụ osisi nwere ụcha dị iche iche na anyanwụ na-ada ada ná mbara ígwé

Gịnị ka ìhè na ụcha dị iche iche ị na-ahụ n’ihe ndị e kere eke na-akụzịrị gị gbasara Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya