Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke Dị
Obi na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ile ihe ndị e kere eke. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ghọtara na ihe ndị e kere eke na-eme ka anyị ghọtakwuo ụdị onye onye kere ha bụ. (Rom 1:20) N’oge ochie, Devid gụrụ Okwu Chineke, jiri ya chọpụta ụdị onye Jehova bụ. Ma, ihe ndị e kere eke o ji anya ya ‘hụ’ mekwara ka ya na Chineke dịrịkwuo ná mma. (Ọma 8:3, 4) Broshọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? ga-enyere ma anyịnwa ma ụmụ anyị ma ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ilerukwu anya n’ihe ndị Jehova kere. Nke a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ụdị onye ọ bụ, ghọtakwuokwa àgwà ya. Mgbe ahụzi, anyị na ya ga-adịkwu ná mma.
Leruo Ihe Ndị Jehova Kere Eke Anya: Jizọs gwara anyị ka anyị ‘leruo anụ ufe nke eluigwe anya’ ma ‘mụta ihe site n’okooko lili dị n’ọhịa.’ (Mat. 6:26, 28) Anyị mee otú ahụ, okwukwe anyị ga-esikwu ike, anyị agaghịkwa enwe obi abụọ ma è nwere onye kere ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo amamihe dị egwu Jehova nwere, meekwa ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-anapụta anyị ma anyị nwee nsogbu. Ekwela ka mere nke a na nke ọzọ juru n’ụwa megharịa gị anya. Wepụta oge leruo ihe ndị Jehova kere eke anya ma hụ otú ha si dị egwu. Ka ị na-ele ha, gbalịa ka ị ghọta ihe ha na-akọrọ gị gbasara Chineke.—Ọma 19:1.