OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Niile Ga-esi Nye Aka n’Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Jehova
Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị abụghị naanị ụlọ nkịtị, kama ọ bụ ebe anyị na-anọ efe Jehova. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi nye aka n’ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị?
LEENỤ VIDIO AHA YA BỤ ILEKỌTA EBE NDỊ ANYỊ NA-ANỌ EFE JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị mere anyị ji enwe ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova?
Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha ma na-arụzi ya?
Olee uru ndị i riterela n’iso arụzi ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova na idebe ha ọcha?
Gịnị mere ịkpachapụ anya na-arụ ọrụ iji zere mmerụ ahụ́ ji dị mkpa, oleekwa ụfọdụ ụzọ e si eme ya ị hụrụ na vidio a?
Olee otú anyị ga-esi eji onyinye anyị sọpụrụ Jehova?
OTÚ M GA-ACHỌ ISI NYE AKA BỤ