AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | TAỊTỌS 1–FAỊLIMỌN
‘Họpụta Ndị Okenye’
Pọl gwara Taịtọs ka ọ ‘họpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche.’ Ihe a e dere na Baịbụl ka a na-emekwa taa n’ihi na ọ bụ ndị nlekọta sekit na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi.
ÒTÙ NA-ACHỊ ISI
Òtù Na-achị Isi na-agbaso ihe e mere n’oge ndịozi. Ha na-enye ndị nlekọta sekit ikike ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi.
NDỊ NLEKỌTA SEKIT
Onye nlekọta sekit ọ bụla na-eji nlezianya tụlee ihe ndị okenye kwuru banyere ụmụnna nwoke ha na-atụ aro ka a họpụta, kpeekwa ekpere maka ya ma họpụtazie ndị nke ruru eru.
NDỊ OKENYE
Ọ bụrụgodị na a họpụtala mmadụ, ya abụrụ okenye, onye ahụ ka kwesịrị ịna-eme ihe ndị ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji ama onye ruru eru ịbụ okenye.