AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 3-5
Ọtụtụ Nsogbu Ụgha Mbụ Ahụ Kpatara
Kemgbe Setan ghachaara Iv ụgha, ọ ka na-eduhiekwa ndị mmadụ. (Mkpu. 12:9) Olee otú ụgha ndị e depụtara n’okpuru ebe a Setan na-agha si eme ka ndị mmadụ ghara ịbịaru Jehova nso?
Chineke adịghị
Chineke bụ Atọ n’Ime Otu dị omimi
Chineke enweghị aha
Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ
Ihe ọ bụla merenụ bụ uche Chineke
Ihe gbasara ụmụ mmadụ anaghị emetụ Chineke n’obi
Olee otú ụgha ndị a Setan na-agha banyere Chineke dị gị n’obi?
Olee otú ị ga-esi nye aka mee ka a mata nke bụ́ eziokwu?