Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Jenụwarị p. 8
  • Otú E Si Eji Traktị Amalite Mkparịta Ụka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Eji Traktị Amalite Mkparịta Ụka
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Traktị Ọhụrụ Ndị Pụrụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Otú E Si Eji “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta” Ezi Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Jiri Traktị Malite Mkparịta Ụka
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Jenụwarị p. 8
Ebe otu nwanna nwaanyị ji traktị ‘Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?’ na-ezi otu nwaanyị ozi ọma n’oge ọ na-anọghị n’ozi ọma n’ọdụ ụgbọala.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú E Si Eji Traktị Amalite Mkparịta Ụka

Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2018, a na-enwe ihe anyị na ndị mmadụ nwere ike ikwurịta na peeji nke mbụ n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. A gbara anyị ume ka anyị lekwasị anya n’iso ndị mmadụ kwurịta okwu kama inye ha naanị akwụkwọ anyị. Iji nyere anyị aka ime ihe a, e nwere vidio mkparịta ụka ndị e jirila gosi anyị otú anyị nwere ike isi jiri naanị Baịbụl malite mkparịta ụka. Ma, ọ̀ pụtara na anyị agaghịzi na-enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị ma anyị nọrọ n’ozi ụlọ n’ụlọ? Mba. Dị ka ihe atụ, iji traktị ezi ozi ọma bụ otu ụzọ magburu onwe ya e si amalite mkparịta ụka. Anyị nwere ike ime ihe ndị e dere n’okpuru ebe a ma anyị chọọ iji traktị amalite mkparịta ụka:

  1. Jụọ onye ahụ ajụjụ dị n’ihu traktị ahụ ka o kwuo nke o chere bụ́ azịza ya.

  2. Gosi ya ihe Baịbụl zara n’amaokwu Baịbụl dị n’elu elu peeji nke abụọ na traktị ahụ. Ọ bụrụ na oge dị, gị na ya tụlee ihe ụfọdụ dị na traktị ahụ.

  3. Nyezie onye ahụ traktị ahụ ma gbaa ya ume ka ọ gụọ ihe ndị ọzọ dị na ya n’oge nke ya.

  4. Tupu gị alawa, gosi ya ajụjụ dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-echebara Echiche,” gwazie ya oge ọzọ ị ga-abịa ka unu jiri Baịbụl mata azịza ajụjụ ahụ.

Traktị bụ́ ‘Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?’ na nọmba ndị e dere na ya nke na-egosi akụkụ dị iche iche nke traktị ahụ.

Ị laghachi, gị na ya tụlee azịza ajụjụ ahụ, gwakwa ya ajụjụ unu ga-atụle n’oge ọzọ. I nwere ike ịhọrọ ajụjụ dị na jw.org, ma ọ bụkwanụ nke dị n’akwụkwọ e sere n’azụ traktị ahụ. N’oge i chere kwesịrị ekwesị, bidozienụ mụwa Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya