OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú E Si Eji “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta” Ezi Ozi Ọma
Kemgbe Jenụwarị 2018, a na-enwe Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta n’ihu akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Olee ihe ndị anyị nwere ike iji ya eme?
Iji Ya Eme Ihe Omume: I kwesịrị iji ajụjụ, amaokwu Baịbụl, na ajụjụ a ga-aza n’oge ọzọ dị n’ebe e kenyere gị mee ihe omume gị. Ma, nke a apụtaghị na ị ga-ekwu ihe niile kpọmkwem otú ahụ e si kwuo ya na vidio ndị ahụ e ji egosi otú e si ezi ozi ọma. I nwere ike ịgbanwetụ ihe ụfọdụ, dị ka, okwu mmalite ha, otú e si kọwaa amaokwu Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ. I nwekwara ike inyefe otu n’ime akwụkwọ dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe ọ bụrụgodị na e kwughị ka e nyefee akwụkwọ n’ihe omume ahụ.
Iji Ya Ezi Ozi Ọma: E dere ihe ndị dị n’ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta iji nyere anyị aka n’ozi ọma. Ọ bụrụ na mmadụ egosi ezigbo mmasị mgbe mbụ i ziri ya ozi ọma, i nwere ike iji ihe dị n’ebe e dere nletaghachi meere ya nletaghachi. I nwere ike ịgbanwetụ ihe e dere ebe ahụ ma ọ bụkwanụ jiri ihe ọzọ dị iche mee nletaghachi ahụ. O nwere ike ịbụ na ihe e kwuru na nke ọnwa gara aga ma ọ bụkwanụ na amaokwu Baịbụl ọzọ ga-aka amasị ndị nọ n’ókèala unu. Ndị bi n’ókèala unu, hà na-enwe mmasị ikwu banyere okwu a kpụ n’ọnụ n’ógbè unu ma ọ bụ ikwu banyere akụkọ a nụrụ na redio? N’agbanyeghị otú anyị si chọọ iji ihe e dere n’ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta zie ozi ọma, ebumnobi anyị kwesịrị ịbụ ‘ime ihe niile n’ihi ozi ọma, ka anyị wee bụrụ ndị na-ezisara ya ndị ọzọ.’—1 Kọr. 9:22, 23.