Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb20 Mee p. 3
  • Ì Jikerela?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Jikerela?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-adị Njikere ná Ngwụcha ‘Oge Ikpeazụ A’
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Ì Jikerela Maka Ọdachi?
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ì Jikerela Maka Ọgba Aghara Nwere Ike Ime n’Obodo?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Die Nsogbu Bịaara Ha
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
mwb20 Mee p. 3
Ebe otu ezinụlọ na-akwakọta akpa ha ga-eji agbapụ ma ọdachi mee.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ì Jikerela?

Ọ bụrụ na ọdachi ndị na-emere onwe ha emee n’ebe i bi ugbu a, ị̀ dị njikere maka ya? Ọdachị ndị dị ka, ala ọma jijiji, ajọ ifufe, ọkụ ọgbụgba, na oké idei mmiri nwere ike ime na mberede, o nwekwara ike imebi ọtụtụ ihe. Ihe ọzọ bụ na ndị na-eyi ọha egwu, ọgba aghara, na ọrịa na-efe efe nwekwara ịkpa mkpamkpa n’ebe ọ bụla na mberede. (Ekli. 9:11) Anyị ekwesịghị iche na ihe ndị a enweghị ike ime n’ebe anyị bi.

Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịdị njikere maka ọdachi. (Ilu 22:3) Ọ bụ eziokwu na nzukọ Jehova na-agbatara anyị ọsọ enyemaka ma e nwee ọdachi, ma nke ahụ apụtaghị na o nweghị ihe anyị ga-eme iji nyere onwe anyị aka.​—Gal. 6:5.

LEENỤ VIDIO BỤ́, Ì JIKERELA MAKA ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Ebe otu nwanna nwoke na-agụ Baịbụl iji mee ka okwukwe ya sie ike maka oge ọdachi.

    Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sie ike tupu ọdachi emee?

  • Akpa e ji agbapụ ma ọdachi mee, ebe mmadụ dere ihe gbasara onwe ya, na ekwentị.

    Gịnị mere o ji dị mkpa . . .

    • • ka anyị na-akọrọ ndị okenye otú ihe sị dịrị anyị mgbe ọdachi na-emebeghị, mgbe ọdachi na-eme, nakwa mgbe o mechara?

    • • ka anyị nwee akpa anyị kwanyere ihe anyị ga-eji agbapụ?​—g17.5 6

    • • ịtụle ụdị ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe i bi na ihe ndị ị ga-eme ma nke ọ bụla n’ime ha mee?

  • Foto ndị na-egosi: Ụzọ ndị anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka ma n’oge ọdachi. 1. Ebe otu nwanna nwoke na-ekpe ekpere. 2. Ebe ndị wepụtara onwe inye aka na-enye aka n’oge ọdachi. 3. Ebe otu nwanna nwoke na-etinye ego n’igbe onyinye dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

    Olee ihe atọ anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka ma ọdachi mee?

Ì NWERE IKE IWEPỤTA ONWE GỊ INYE AKA?

A chọkwuru ndị ga na-enye aka agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka ma ọdachi mee. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye aka, gwa ndị okenye unu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya