Ì Jikerela Maka Ọdachi?
1. Gịnị mere anyị ji kwesi ijikere maka ọdachi?
1 Kwa afọ, ala ọma jijiji, idei mmiri, ọgba aghara, agha na ọdachi ndị ọzọ na-akpa ọtụtụ nde mmadụ aka ọjọọ. N’agbanyeghị ebe anyị bi, ndị ọjọọ nwere ike bịa tụọ bọmbụ ma ọ bụkwanụ jiri ihe ndị ọzọ sụọ ndị mmadụ akwụ. Ọtụtụ ụmụnna anyị sokwa ná ndị ihe ndị a na-akpa aka ọjọọ.
2. Gịnị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike?
2 Ọ bụ eziokwu na ihe na-esikwu ike n’ụwa, ndị ohu Chineke ekwesịghị ịtụ ụjọ ma ọ bụ chegbuwe onwe ha. Baịbụl mere ka anyị mara ihe mere ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a ji eme. Anyị makwa na ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa a. (2 Tim. 3:1, 13) Ma, Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-enyere anyị aka ka ihe ọ bụla ghara imebi mmekọrịta anyị na ya. Dị ka ihe atụ, ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla mebie mmekọrịta anyị na ya n’oké mkpagbu nke a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. Ị manụ na oké mkpagbu ahụ ga-aka ihe ọ bụla merela ụmụ mmadụ. Oké mkpagbu ahụ gachaa, Chineke ga-emere ndị lanahụrụ ya ọtụtụ ihe ọma n’Alaeze ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 14:7) Ka ọ dị ugbu a, anyị ga na-enwe ọdachi. Ebe ọ bụ na ọdachi nwere ike ịdakwasị anyị mgbe anyị na-atụghị anya ya, anyị kwesịrị ijikere maka ya.—Ilu 21:5.
3. Ònye ga-ekpebiri mmadụ ma ọ̀ ga-agbapụ ma ọ̀ ga-anọrọ ma a chọpụta na a na-aga inwe nsogbu n’ebe o bi?
3 Ihe Ndị Ị Ga-eme Tupu E Nwee Ọdachi: Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-agwa ndị mmadụ ma ọdachi chọọ ime. Anyị kwesịrị ige ha ntị ma ha gwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. (Ilu 22:3) Ndị ọchịchị kwuo na a ga-enwe ọdachi, ndị okenye ga-agba mbọ nyere ndị nọ n’ọgbakọ ha aka ka ha jikere maka ya. Anya kwesịrị ịdị ndị okenye nkọ mgbe niile ka ha nwee ike ịma ihe ndị na-eme gburugburu ebe ha bi. Nke a ga-enyere ha aka ịma otú ha ga-esi nyere ndị nkwusa aka. Ma, ọ bụghị ndị okenye ga-ekpebiri ndị nkwusa ihe ha ga-eme n’okwu a, ha ekwesịghịkwa ịmanye ha ka ha mee ihe ha kwuru. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọpụta na a na-aga inwe nsogbu n’ebe i bi, echerela ka i buru ụzọ nata ndị okenye ikike, ma ọ bụkwanụ ka alaka ụlọ ọrụ gwa gị ihe ị ga-eme tupu ị gbapụ. Ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-agbapụ ma ọ bụ na ị gaghị agbapụ. Mmadụ ekwesịghị ịmanye onye ọzọ ka ọ nọrọ. E kwesịghịkwa ịmanye onye ọzọ ka ọ gbapụ ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịgbapụ.—Gal. 6:5.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwee ọgba aghara n’ebe anyị bi ma ọ bụkwanụ na ndị ọjọọ tụrụ bọmbụ n’ebe ahụ?
4 Ndị ọjọọ na-atụ bọmbụ mgbe anyị na-atụghị anya ya, ọ bụkwa otú ahụ ka ọgba aghara si amalite. Baịbụl gwara anyị ka anyị mara ihe, mụrụ anya ma na-elezi anya mgbe niile. (Ilu 27:12) N’ihi ya, anya kwesịrị ịdị anyị nkọ mgbe niile ka anyị nwee ike ịma ihe ndị na-eme gburugburu ebe anyị nọ. Anyị ga-achọ ka onye ọ bụla gbaa mbọ ka ihe ghara ime ma yanwa ma ndị ọzọ. Ihe ọ pụtara bụ na e nwere mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka i si n’ebe a na-enwekarị nsogbu kwapụ gaa ebe nsogbu na-adịghị ma nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ala dara jụụ. Obi dị anyị ụtọ na ụfọdụ emeela otú ahụ n’agbanyeghị na ha hapụrụ ihe ha nwere gbaa ọsọ ndụ n’ihi na ndụ ka akụ̀. (Luk 12:15) Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma mmadụ kworo ihe ndị o nwere sie ọnwụ nọrọ n’ebe ọ ma na ihe nwere ike ime ya.
5. Ọ bụrụ na anyị bi n’ebe a na-enwekarị ọdachi ma ọ bụ ọgba aghara, gịnị ka anyị ga-eme ma ndị okenye kwuo ihe a ga-eme?
5 Ọ bụrụ na ọdachi na-emekarị n’ebe unu bi, ma ọ bụkwanụ na ihe ndị na-eme n’ebe ahụ gosiri na e nwere ike inwe ọgba aghara, ndị okenye nwere ike ịgwa ndị nkwusa ka ha nye ha adres ma ọ bụ nọmba ekwentị onye ezinụlọ ha na-ebighị n’ebe ahụ ka ha nwee ike ịkpọtụrụ ya ma ihe gbata gbata mee. Nke a ga-eme ka ndị okenye mara ebe ndị nkwusa gbara ọsọ ndụ nọ. Ndị okenye nwekwara ike ide ihe ndị ha ga-eji enyere ndị nkwusa gbara ọsọ ndụ aka, otú ndị nkwusa ga-esi gbapụ, na otú a ga-esi enyere ndị nkwusa ụfọdụ aka ma ọ bụrụ na ha agaghị agbapụli n’onwe ha. Ọ bụrụ na ndị okenye ekwuo otú a ga-esi eme ihe ndị a, ọ ga-abara anyị uru ma anyị mee ihe ha kwuru.—Hib. 13:17.
6. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwee ọdachi n’ebe anyị bi? (b) Olee ihe mere anyị ji kwesị inye ndị okenye adres anyị na nọmba ekwentị anyị?
6 Ihe Ị Ga-eme ma Ọdachi Mee: Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwee ọdachi ma ọ bụ ọgba aghara n’ebe i bi? Hụ na ezinụlọ gị nwetara nri, mmiri, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Gbalịa nyere ndị ọzọ aka otú ike kwere gị. Gbalịa mee ka onye na-elekọta ìgwè ozi ubi unu ma ọ bụ okenye ọzọ mara ebe ị nọ. I kwesịrị ime ka a mara ebe ị nọ, a sịgodi na nsogbu adịghị n’ebe ahụ ma ọ bụkwanụ na o nweghị ihe dị gị mkpa. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị ga-achọ ka ụmụnna meere gị, obi kwesịrị isi gị ike na ụmụnna na-agbakeri ala achọ otú ha ga-esi nyere gị aka. (1 Kọr. 13:4, 7) Cheta na Jehova ma mkpa gị; tụkwasị ya obi na ọ ga-enyere gị aka. (Ọma 37:39; 62:8) E nwee ndị i kwesịrị ịkasi obi na ndị i kwesịrị ịgba ume ka okwukwe ha sie ike, gbalịa mee ya. (2 Kọr. 1:3, 4) Ndị okenye kwesịkwara ịgba mbọ mara ma ndị nọ n’ọgbakọ ha hà nọ n’ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme ha. Ha kwesịkwara ịma ihe ndị dị ha mkpa. Ọ bụrụ na ndị okenye amaghị ebe ụmụnna nọ na nọmba ekwentị ha, ha nwere ike igbu oge ebe ha na-achọ otú ha ga-esi akpọtụrụ ha. N’ihi ya, ndị nkwusa kwesịrị inye odeakwụkwọ ọgbakọ ha na onye na-elekọta ìgwè ozi ubi ha adres nakwa nọmba ekwentị ha.
7. Gịnị ka anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike n’ebe anyị gbagara ọsọ ndụ?
7 Ihe ị ga-eme n’ebe ị gbagara ọsọ ndụ: N’agbanyeghị ebe anyị nọ mgbe e nwere nsogbu, ọ dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sie ike, ghara ikwe ka ihe ọ bụla mebie mmekọrịta anyị na Chineke. Ọ bụrụ na ọ ga-esi ike ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụkwanụ na ihe nwere ike mee mmadụ n’ụzọ, ndị nkwusa ole na ole nwere ike izukọ mụọ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe n’izu ahụ. Ìgwè ozi ubi nke ọ bula nwekwara ike izukọ mụọ ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Ọ bụrụ na ihe ndị a niile agaghị ekwe omume, ezinụlọ ọ bụla nwere ike ịna-amụ ihe ndị ahụ ná mgbede ezinụlọ ha ji enwe ofufe ezinụlọ ruo mgbe ala dara jụụ, bụ́ mgbe ọgbakọ ga-amalitekwa ịmụkọ ihe ọnụ. Mgbe ọ bụla e nwere ụdị nsogbu a, onye ọ bụla kwesịrị iji akọ kwusaara onye chọrọ ịnụ “ozi ọma nke ihe ka mma,” ozi ọma. (Aịza. 52:7) Ọnwa gwụ, onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ịgba mbọ nye odeakwụkwọ ọgbakọ akụkọ ozi ya. O nwekwara ike inye ya onye na-elekọta ìgwè ozi ubi ọ nọ ma ọ bụ onye na-enyere ya aka. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-arụ ọrụ anyị nke bụ́ ‘ikwusa okwu Chineke n’oge dị mma na n’oge nsogbu.’—2 Tim. 4:2.
8. Gịnị ka ọdachi na ọgba aghara ndị a na-enwe taa kwesịrị ime ka anyị mee?
8 Ọ bụ eziokwu na ọdachi na ọgba aghara na-eme ka ndị mmadụ na-echegbu onwe ha, obi kwesịrị isi anyị ike n’ihi na ihe ndị a ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 21:4) Ugbu a ka anyị kwesịrị ijikere maka ọdachi ma gbalịsie ike jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ndị Ị Ga-eme:
• Dewe akwụkwọ ndị dị gị mkpa ebe ị ga-ewere ha ngwa ngwa gbapụ.
• Dewe ihe ndị dị mkpa i nwere ike iji gbapụ ozugbo. Ha ga-abụ ihe ndị dị ka nri, ọgwụ, na ezigbo mmiri ọṅụṅụ. I kwesịkwara iwere ndị ga-ezuru gị ma ọ́ dịghị ihe ọzọ abalị atọ ruo abalị ise.
• Jikere ịgbapụ ozugbo, marakwa ebe ị ga-agbaga.
• Mee ihe ndị ọchịchị na ndị okenye ọgbakọ gwara gị.