AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 13-14
“Guzosienụ Ike Hụ Nzọpụta Jehova”
Jehova bụ Chi na-azọpụta ndị ya. Ọ bụkwa Chi na-echebara ndị ya echiche. Olee otú o si chebara ụmụ Izrel echiche mgbe o si n’ala Ijipt na-akpọpụta ha?
Ọ haziri ụmụ Izrel ahazi.—Ọpụ. 13:18
O duziri ha ma chebe ha.—Ọpụ. 14:19, 20
Ọ zọpụtara ndị ya niile ma ụmụaka ma ndị agadi.—Ọpụ. 14:29, 30
Olee ihe obi siri gị ike na Jehova ga-eme n’oge oké mkpagbu?—Aịza. 30:15