AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 15-16
Jiri Abụ Too Jehova
Egwú nwere ike imetụta ihe anyị na-eche n’echiche na otú obi na-adị anyị. Ịbụ abụ bụ otu ihe dị mkpa anyị na-eme n’ofufe Jehova.
Mozis na ụmụ Izrel bụkuru Jehova abụ otuto n’ihi ọrụ ebube ọ rụrụ n’Osimiri Uhie napụta ha n’aka ndị Ijipt
Eze Devid họpụtara puku ndị ikom anọ ka ha na-akụ egwú ma na-abụ abụ n’ụlọ nsọ Chineke
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi bụkuru Jehova abụ otuto n’abalị ya na ha nọ tupu e gbuo ya
Olee ohere ọma ndị m nwere iji bụkuo Jehova abụ otuto?