Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Jenụwarị p. 5
  • Chebe Alụmdi na Nwunye Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chebe Alụmdi na Nwunye Gị
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nwee Ọṅụ n’Alụmdi na Nwunye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Jenụwarị p. 5
Ebe otu nwoke nọ nwunye ya n’akụkụ jiri obi ụtọ soro ya na-asụ ákwà.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Chebe Alụmdi na Nwunye Gị

Jehova ejighị nkwa di na nwunye kwere ibe ha n’ụbọchị agbamakwụkwọ egwu egwu. O kwuru na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha. (Mat. 19:5, 6) E nwere ọtụtụ ndị Jehova alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. Ma, e nweghị alụmdi na nwunye zuru okè. A ga-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị chere na ọ bụrụ na di na nwunye na-esekarị okwu, ihe ga-ebi ya bụ ha ikewa ma ọ bụ ha ịgba alụkwaghịm. Anyị ekwesịghị inwe ụdị echiche a. Olee ihe ga-enyere ndị di na nwunye aka ka ha ghara itisa?

Lee ihe ise dị mkpa nwere ike inye aka.

  1. Chebe obi gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ izere ihe ndị dị ka ịchụ nwoke ma ọ bụ ịchụ nwaanyị na ntụrụndụ a na-eme ihe rụrụ arụ na ya. Ihe ndị a na-emebi alụmdi na nwunye.—Mat. 5:28; 2 Pita 2:14.

  2. Mee ka gị na Chineke dịkwuo ná mma, na-agbalịsikwa ike ime ihe dị ya mma n’ezinụlọ gị.—Ọma 97:10.

  3. Nọgide na-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ. Na-emekwara di gị ma ọ bụ nwunye gị ụmụ irighiri ihe ọma ndị ga-eme ka ihe dịtụrụ ya mfe.—Kọl. 3:8-10, 12-14.

  4. Na-ekwurịtanụ okwu nke ọma, na-akwanyekwaranụ ibe unu ùgwù.—Kọl. 4:6.

  5. Jirinụ ịhụnanya na-enye ibe unu ihe ruuru ya.—1 Kọr. 7:3, 4; 10:24.

Ọ bụrụ na di na nwunye ejiri alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe, ha na-akwanyere Jehova ùgwù bụ́ onye malitere alụmdi na nwunye.

LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ANYỊ JIRI “NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ”—NA-EDEBE IWU NDỊ NA-ACHỊKWA ỌSỌ AHỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Ka Anyị Jiri “Ntachi Obi Na-agba Ọsọ”—Na-edebe Iwu Ndị Na-achịkwa Ọsọ Ahụ.’ Ebe Nwanna Calou na nwunye ya na-enwe obi ụtọ mgbe e kwuchara okwu agbamakwụkwọ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

    Ọ bụ eziokwu na alụmdi na nwunye nwere ike ibido nke ọma, ma olee nsogbu ndị nwere ike ịmalite?

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Ka Anyị Jiri “Ntachi Obi Na-agba Ọsọ”—Na-edebe Iwu Ndị Na-achịkwa Ọsọ Ahụ.’ Ebe Nwanna Calou na nwunye ya medara obi na-ekwurịta nsogbu ndị ha na-enwe, Baịbụl e mepere emepe nọ na tebụl.

    Olee otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere ndị chere na ịhụnanya adịghị n’ezinụlọ ha aka?

  • Foto si na vidio bụ́ ‘Ka Anyị Jiri “Ntachi Obi Na-agba Ọsọ”—Na-edebe Iwu Ndị Na-achịkwa Ọsọ Ahụ.’ Ebe Nwanna Calou na-agụrụ nwunye ya na ụmụ ya abụọ ‘Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible.’

    Na-emenụ ihe Baịbụl kwuru ka unu na-enwe obi ụtọ n’ụlọ unu

    Olee iwu ndị Jehova nyere gbasara alụmdi na nwunye?

  • Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma, olee ihe ha abụọ kwesịrị ịna-eme?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya