Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 9/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Chebe Alụmdi na Nwunye Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mee Ka Gị na Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-enwe Obi Ụtọ
    Teta!—2006
  • Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-adịkwu ná Mma ma Na-enwe Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 9/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha na-ebi n’udo?

Ihe niile Baịbụl kwuru gbasara otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo ga-abara di na nwunye uru n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, kwuru ihe ndị ahụ. Baịbụl na-akụziri di na nwunye àgwà ndị nwere ike ime ka ha na-ebi n’udo, na-akụzikwara ha àgwà ndị ha na-ekwesịghị ịkpa bụ́ ndị nwere ike ime ka ha ghara ibi n’udo. Ọ na-akụzikwara ndị di na nwunye otú ha ga-esi na-ekwurịta okwu ka ha na-enwekwu obi ụtọ n’ezinụlọ ha.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:8-10, 12-14.

Ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-akwanyere ibe ha ùgwù. Ha ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime ha ana-arụ ọrụ Chineke nyere ya.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:18, 19.

Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara ịhapụ ibe ha?

Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya, ha agaghị ahapụ ibe ha. Chineke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi hụ ndị ọzọ n’anya. Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, gosikwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ya eme.—Gụọ 1 Jọn 4:7, 8, 19.

Ọ bụrụ na di na nwunye aghọta na alụmdi na nwunye si n’aka Chineke ma jiri ya kpọrọ ihe, ha agaghị ahapụ ibe ha. Mgbe Chineke malitere alụmdi na nwunye, ọ chọrọ ka a ghara inwe mgbe di na nwunye ga-ahapụ ibe ha. Di na nwunye nwere ike ibi n’enweghị onye ga-ahapụ ibe ya n’ihi na Chineke kere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị otú ha ga-enwe ike ịna-egboro ibe ha mkpa ha. O kekwara ha n’onyinyo ya, ka ha nwee ike ịna-ahụ ibe ha n’anya.—Gụọ Jenesis 1:27; 2:18, 24.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 14 nke 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwere ike ịdanlodu akwụkwọ a n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya