Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 9 ajụjụ 1-5
  • Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ga-eme Ka Ezinụlọ Gị Nwee Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 9 ajụjụ 1-5

ISI NKE 9

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?

1. Gịnị mere nwoke na nwaanyị ịlụ alụ tupu ha ebiri ji eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha?

Ebe di na nwunye na-edejupụta akwụkwọ mgbe ha na-agba akwụkwọ

Ọ bụ Jehova, onye obi ụtọ, ka ozi ọma ahụ si n’aka. Ọ chọkwara ka ezinụlọ niile na-enwe obi ụtọ. (1 Timoti 1:​11) Ọ bụ yanwa malitere alụmdi na nwunye. Nwoke na nwaanyị lụọ alụọ tupu ha ebiri, ọ ga-eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha. Ha ga-agbakọ aka zụọ ụmụ ha otú obi ga-eru ha ala. Ndị Kraịst kwesịrị idebanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ otú iwu obodo ha kwuru.​—Gụọ Luk 2:1, 4, 5.

Olee otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya? Ọ chọghị ka di na nwunye hapụ ibe ha. Jehova achọghị ka di ma ọ bụ nwunye na-agba n’èzí. (Ndị Hibru 13:⁠4) Ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị. (Malakaị 2:​16) Ma, o kwuru na ọ bụrụ na di Onye Kraịst ma ọ bụ nwunye ya akwaa iko, onye nke aka ya dị ọcha nwere ike gbaa ibe ya alụkwaghịm, lụrụ onye ọzọ​—Gụọ Matiu 19:3-6, 9.

2. Olee otú di na nwunye kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

Di na nwunye na-enwe aṅụrị

Jehova kere nwoke na nwaanyị ka ha na-enyere ibe ha aka ma ha lụọ. (Jenesis 2:18) Ebe ọ bụ na di bụ onyeisi ezinụlọ, ọ bụ yanwa kwesịrị ịna-akpa afọ ezinụlọ ya. Ọ bụkwa yanwa kwesịrị ịna-akụziri ha Okwu Chineke. O kwesịrị ịna-achọ ọdịmma nwunye ya, ọ bụghị naanị nke ya. Di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ebe ọ bụ na ma di ma nwunye enweghị nke zuru okè, ha abụọ kwesịrị ịna-agbaghara ibe ha ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka udo na-adị n’ezinụlọ ha.​—Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:22-25, 33; 1 Pita 3:7.

3. Ì kwesịrị ịhapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụrụ na unu anaghị ebi n’udo?

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị enwee nsogbu, gbalịanụ dozie ya. Na-emesokwanụ ibe unu ihe n’obiọma. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Chineke achọghị ka di na nwunye hapụ ibe ha ma ha nwee nsogbu.​—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:10-13.

4. Ụmụaka, gịnị ka Chineke buuru unu n’obi?

Ebe nne na nna na akụziri ụmụ ha ihe

Jehova chọrọ ka obi na-adị unu ụtọ. O nyere unu ndụmọdụ kacha mma nke ga-eme ka obi na-atọ unu ụtọ n’oge a unu ka na-eto eto. Ọ chọrọ ka unu gee ndị mụrụ unu ntị, ka unu wee rite uru n’amamihe ha nwerela ná ndụ. (Ndị Kọlọsi 3:20) Jehova chọkwara ka unu jiri oge a unu na-eto eto jeere ya na Ọkpara ya ozi. Unu manụ na ọ bụ yanwa kere unu. Ọ bụrụ na unu ejeere ya ozi, unu ga-enwe ezigbo obi ụtọ.​—Gụọ Ekliziastis 11:9–12:1; Matiu 19:13-15; 21:15, 16.

5. Ndị nne na nna, gịnị ka unu ga-eme ka obi na-atọ ụmụ unu ụtọ?

Ebe nna na-agwa nwa ya okwu

Unu kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-akpa afọ ụmụ unu, na-azụrụ ha uwe ma hụ na e nwere ebe ha bi. (1 Timoti 5:8) Ma, ọ bụrụ na unu chọrọ ka obi na-adị ụmụ unu ụtọ, unu kwesịkwara ịkụziri ha ka ha hụ Chineke n’anya ma na-ege ya ntị. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụ na unu hụrụ Chineke n’anya, o nwere ike mee ka ụmụ unu hụkwa ya n’anya. Ụmụ unu ga-amụta iche echiche nke ọma na ịkpa ezigbo àgwà ma ọ bụrụ na unu ejiri Okwu Chineke na-akụziri ha ihe.​—Gụọ Diuterọnọmi 6:4-7; Ilu 22:6.

Ịja ụmụaka mma na ịgba ha ume na-eme ka ha na-agbakwu mbọ. Ọ dịkwa mkpa ka a na-abara ha mba ma gbazie ha ma ha mee ihe ọjọọ. Isi otú a na-azụ ha ga-eme ka ha ghara ime ihe ha ga-emecha kwaa mmakwaara ná ndụ. (Ilu 22:15) Ma, unu ekwesịghị ịna-eji obi ọjọọ ma ọ bụ aka ike na-adọ ha aka ná ntị.​—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:21.

Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ dị iche iche ndị na-enyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka. Ihe a na-ede na ha na-esikwa na Baịbụl.​—Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya