Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 10/1 p. 16-17
  • Gịnị Ga-eme Ka Ezinụlọ Gị Nwee Obi Ụtọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-eme Ka Ezinụlọ Gị Nwee Obi Ụtọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 10/1 p. 16-17

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Ga-eme Ka Ezinụlọ Gị Nwee Obi Ụtọ?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ga-aza gị ajụjụ ndị ahụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị mere nwoke na nwaanyị ịlụ alụ tupu ha ebiri ji eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha?

Ọ bụ Jehova, bụ́ Chineke onye obi ụtọ, bidoro alụmdi na nwunye. Nwoke na nwaanyị ịlụ alụ tupu ha ebiri na-eme ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ ha n’ihi na ọ ga-eme ka ha na-emekọ ihe ọnụ, meekwa ka ha gbakọọ aka zụọ ụmụ ha n’ezinụlọ ebe obi ga-eru ụmụ ha ala. Olee otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya? Ọ chọrọ ka di na nwunye ghara ịhapụ ibe ha nakwa ka ha lụọ otú iwu obodo kwuru. (Luk 2:1-5) Chineke achọghị ka di ma ọ bụ nwunye na-agba n’èzí. (Ndị Hibru 13:4) Jehova kwuru na naanị mgbe Onye Kraịst nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ bụ ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha akwaa iko.—Gụọ Matiu 19:3-6, 9.

2. Olee otú di na nwunye kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

Jehova kere nwoke na nwaanyị ka ha na-enyere ibe ha aka ma ha lụọ. (Jenesis 2:18) Ebe ọ bụ na di bụ onyeisi ezinụlọ, ọ bụ ya kwesịrị ibute ụzọ n’ịkpa afọ ezinụlọ ya na ịkụziri ha banyere Chineke. O kwesịrị ịna-achọ ọdịmma nwunye ya, ọ bụghị naanị nke onwe ya. Di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ebe ọ bụ na o nweghị di na nwunye zuru okè, di na nwunye ịgbaghara ibe ha bụ otu ihe dị mkpa ga-eme ka ha nwee obi ụtọ.—Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:22-25, 33; 1 Pita 3:7.

3. Ì kwesịrị ịhapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụrụ na unu anaghị ebi n’udo?

Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe nsogbu, gbalịanụ jiri ịhụnanya na-emeso ibe unu ihe. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Okwu Chineke akwadoghị ka di na nwunye hapụ ibe ha n’ihi nsogbu ha na-enwe. Ma, ọ bụrụ na nsogbu ahụ bụ ihe ọnwụ na ndụ, Onye Kraịst ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gaa biri iche.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:10-13.

4. Ụmụaka, gịnị ka Chineke buuru unu n’obi?

Jehova chọrọ ka unu nwee obi ụtọ. Ọ na-enye unu ndụmọdụ kacha mma nke ga-eme ka unu nwee obi ụtọ n’oge a unu ka na-eto eto. Ọ chọrọ ka unu gee ndị mụrụ unu ntị ka unu wee rite uru n’amamihe ha nwerela ná ndụ. (Ndị Kọlọsi 3:20) Obi dị Jehova ụtọ maka ihe ọ bụla unu na-eme iji too ya.—Gụọ Ekliziastis 11:9–12:1; Matiu 19:13-15; 21:15, 16.

5. Ndị mụrụ ụmụ, gịnị ka unu ga-eme ka ụmụ unu nwee obi ụtọ?

Unu kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-akpa afọ ụmụ unu, na-azụrụ ha uwe ma hụ na e nwere ebe ha bi. (1 Timoti 5:8) Ma, ọ bụrụ na unu chọrọ ka ụmụ unu nwee obi ụtọ, unu kwesịkwara ịkụziri ha otú ha ga-esi hụ Chineke n’anya nakwa otú ha ga-esi mụta ihe n’aka Chineke. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụ na unu hụrụ Chineke n’anya, ụmụ unu ga-amụta ime otú ahụ. Ha ga-amụtakwa iche echiche nke ọma na ịkpa ezigbo àgwà ma ọ bụrụ na unu ejiri Okwu Chineke na-akụziri ha ihe.—Gụọ Diuterọnọmi 6:4-7; Ilu 22:6.

Ịja ụmụaka mma na ịgba ha ume na-abara ha uru. Ọ dịkwa mkpa ka a na-abara ha mba ma gbazie ha ma ha mee ihe ọjọọ. Isi otú a na-azụ ha ga-eme ka ha ghara ime ihe ga-ewetara ha obi ọjọọ ná ndụ. (Ilu 22:15) Ma, unu ekwesịghị iji obi ọjọọ ma ọ bụ aka ike na-adọ ha aka ná ntị.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:21.

Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ dị iche iche ndị na-enyere ndị nne na nna na ụmụ ha aka. Ihe e dere na ha si na Baịbụl.—Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 14 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya