OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nọgide Na-azụ Ikike Iche Echiche Gị
Onye na-eme egwuregwu ga-anọgide na-azụ ahụ́ ya ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịna-eme nke ọma n’egwuregwu ọ na-eme. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’ịzụ ikike iche echiche anyị. Anyị kwesịrị ịnọgide na-azụ ya ka o nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma. (Hib. 5:14) Anyị nwere ike ịna-achọkarị ime ụdị mkpebi ndị ọzọ mere. Ma, anyị kwesịrị ịzụ ikike iche echiche anyị, jirikwa aka anyị na-eme mkpebi. Gịnị mere ihe a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka mkpebi ndị o mere.—Rom 14:12.
Anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị ga na-eme mkpebi dị mma naanị n’ihi na o teela anyị mere baptizim. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme mkpebi dị mma, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam, tụkwasịkwa Okwu ya na nzukọ ya obi kpamkpam.—Josh. 1:7, 8; Ilu 3:5, 6; Mat. 24:45.
LEENỤ VIDIO BỤ́ ‘NWEENỤ EZI AKỌNUCHE,’ ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee mkpebi Emma kwesịrị ime?
Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwuwe ihe anyịnwa chere n’okwu gbasara ihe mmadụ ga-eji akọnuche ya kpebie?
Olee ezigbo ndụmọdụ otu di na nwunye nyere Emma?
Olee ebe Emma chọtara ihe nyeere ya aka ịma ihe ọ ga-eme?