Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Mee p. 5
  • Ì Jikerela Maka Ihe Isi Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Jikerela Maka Ihe Isi Ike?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Jikerela?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Nọgide Na-adị Njikere ná Ngwụcha ‘Oge Ikpeazụ A’
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ì Jikerela Maka Ọgba Aghara Nwere Ike Ime n’Obodo?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Mee p. 5

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ì Jikerela Maka Ihe Isi Ike?

Ọ naghị eju anyị anya ma ihe ndị na-eme n’ụwa mee ka ihe siwere ndị mmadụ ike n’ebe niile. Gịnị mere ọ naghị eju anyị anya? Ọ bụ n’ihi na anyị bi ná ngwụcha ngwụcha oge ikpeazụ. Baịbụl gwakwara anyị ka anyị ghara ịtụkwasị “akụnụba a na-ejighị n’aka” obi. (1 Tim. 6:17; 2 Tim. 3:1) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Jehoshafat banyere ijikere maka ihe isi ike?

Mgbe ndị iro ndị Izrel na-achọ ịlụso ha agha, Jehoshafat tụkwasịrị Jehova obi. (2 Ihe 20:9-12) O mekwara ihe ụfọdụ iji kwadebe obodo ya maka agha, dị ka ịrụ obodo ndị siri ike na idowe ndị agha n’ebe dị iche iche. (2 Ihe 17:1, 2, 12, 13) Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ka Jehoshafat, meekwa ihe ndị anyị kwesịrị ime iji jikere maka ihe isi ike.

OLEE IHE NDỊ ANYỊ NWERE IKE IME IJI JIKERE MAKA IHE ISI IKE?

Mee ka adịm ná mma gị na Jehova sikwuo ike: Ka ihe ndị i nwere ju gị afọ, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyeli gị ihe ndị dị gị mkpa n’ụbọchị ọ bụla. (Mat. 6:26; 1 Tim. 6:8) Kpebisie ike na ị gaghị emebi iwu Chineke iji nweta ihe ndị na-akpa gị. (Rom 2:21) Chee banyere otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl nakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ma ọ bụrụ na e nweghị ọkụ eletrik ma ọ bụ Ịntanet. Gbalịa nweta akwụkwọ ụfọdụ e biri ebi. Ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe gị omume, si na jw.org were akwụkwọ na vidio ndị ga-adị gị mkpa ugbu a tupu ihe esie ike.

Wekọta ihe ndị dị mkpa: Tupu ihe esie ike, gbalịa kwụchapụ ụgwọ ndị i ji. Selatakwa aka n’imefusị ego n’ihe ndị na-adịghị mkpa. (Ilu 22:7) O kwe mee, wekọta ihe oriri butụrụ ibu na ihe ndị ọzọ dị mkpa dowe. Ụfọdụ ndị nwekwara ike ile ma hà ga-enwe ntakịrị ubi ebe ha ga na-akọ akwụkwọ nri. Ọ ga-enyere ha aka ibelata mmefu.

LEENỤ VIDIO BỤ́ Ì JIKERELA MAKA ỌDACHI?, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

Foto si na vidio bụ́ “Ì Jikerela Maka Ọdachi?” N’ime foto ahụ, e sere Baịbụl, akpa e tinyere ihe ndị a ga-eji agbapụ n’oge nsogbu na ekwentị, nakwa ndị na-arụ ụlọ.
  • Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji jikere maka ọdachi?

Foto si na vidio bụ́ “Ì Jikerela Maka Ọdachi?” Ebe ụmụnna na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ha si n’ụgbọala na-ebutu onyinye, na-arụkwara ndị ahụ ọdachi dakwasịrị ụlọ.
  • Olee otú anyị nwere ike isi jikere maka inyere ndị ọzọ aka?

IHE UNU GA-AGBA MBỌ MEE

Unu nwewe ofufe ezinụlọ, tụleenụ ihe dị na Teta! Nke 1 2022. Kwurịtazienụ ihe ndị ọzọ unu nwere ike ime iji jikere maka ọdachi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya