OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndokwa E Mere Maka Ịkasi Ndị Nọ na Betel Obi
E nweghị onye ọnwụnwa na-anaghị abịara, e nweghịkwanụ onye nkasi obi na enyemaka na-anaghị adị mkpa. Ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ nakwa ndị nwere nnukwu ihe ùgwù ná nzukọ Jehova nwedịrị ike ịda mbà n’obi. (Job 3:1-3; Ọma 34:19) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta ná ndokwa e mere maka ịkasi ndị ezinụlọ Betel obi na inyere ha aka?
LEENỤ VIDIO BỤ́ “TỤKWASỊ CHINEKE OBI,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee nsogbu ha na ndị ezinụlọ Betel na-alụ?
Olee ihe anọ a na-eme iji kasie ha obi?
Olee uru ụmụnna ndị ahụ na-akasi ndị ezinụlọ Betel obi riterela?