OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndị Mụrụ Ụmụ, Na-akụzirinụ Ụmụaka Unu Otú Ha Ga-esi Na-eme Chineke Obi Ụtọ
Jehova ji ụmụaka kpọrọ ihe. Ọ na-ahụ otú ha si emekwu nke ọma n’ọgbakọ nakwa otú ha si atachi obi. (1 Sam. 2:26; Luk 2:52) Ọ bụrụgodị na ụmụaka ka dị ezigbo obere, àgwà ọma ha nwere ike ime Jehova obi ụtọ. (Ilu 27:11) Jehova ejirila nzukọ ya nye ndị mụrụ ụmụ ezigbo ngwá ọrụ ndị ha ga-eji akụziri ụmụaka ha ịhụ Jehova n’anya na irubere ya isi.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ NA-ETO ETO, UNU NA-EME JEHOVA OBI ỤTỌ MA UNU NA-ATACHI OBI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Kemgbe ọtụtụ afọ, olee otú Jehova sirila nyere ụmụaka aka ma duzie ha?
Olee ihe ndị e nwere ugbu a na-enyere ndị mụrụ ụmụ aka?
Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto, olee ihe Jehova nyere ndị ya nke baarala gị uru? Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?