Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w20 Disemba p. 30
  • Ì Chetara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Chetara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe I Chere na Ị Gaghịzi Edili Nsogbu Ndị Na-abịara Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Mụta Ihe n’Ihe Atụ Ndị Dị n’Abụ E Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Sọl Dị Umeala n’Obi ná Mmalite
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Ndị Na-erubere Jehova Isi Na-emezu Nkwa Ha Kwere Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
w20 Disemba p. 30

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ a nke ọma? Ngwa lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị e tere mmanụ ihe?

Obi dị anyị ụtọ maka okwukwe ha nwere. Ma, anyị anaghị abịa mesowa ha n’ụzọ pụrụ iche. Anyị na-agbalị ka anyị ghara ịbụ ndị “na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ.” (Jud 16) Anyị anaghị abịa ghụwa ha ọnụ ka ha kọọrọ anyị banyere olileanya ha nwere ịga eluigwe.—w20.01, peeji nke 29.

Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova maara gị nke ọma?

Baịbụl kwuru na ọ hụrụ gị mgbe ị ka nọ n’afọ. Ọ na-anụkwa ekpere gị. Ọ ma ihe ị na-eche na ihe dị gị n’obi. Ihe ndị ị na-eme nwekwara ike iwute ya ma ọ bụ mee ya obi ụtọ. (1 Ihe 28:9; Ilu 27:11) Ọ bụ ya dọtara gị ka ị bịa fewe ya.—w20.02, peeji nke 12.

Olee oge ndị anyị kwesịrị ikwu okwu na oge ndị anyị kwesịrị ịgba nkịtị?

Anyị na-eji obi ụtọ ekwu banyere Jehova. Anyị anaghị agba nkịtị ma anyị hụ onye na-eme ihe ga-eduba ya ná mmehie. Ndị okenye na-enye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Anyị anaghị agwa ndị ọzọ banyere otú ọrụ anyị si aga ná mba ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu. Anyị anaghị agwa ndị ọzọ ihe ndị ha na-ekwesịghị ịma.—w20.03, peeji nke 20 ruo na nke 21.

Olee otú igurube ndị ahụ e kwuru okwu ha na Joel isi 2 si dị iche ná ndị nke e kwuru okwu ha ná Mkpughe isi 9?

Na Joel 2:20-29 Chineke sị na ọ ga-achụsasị igurube ndị ahụ ma tie ndị ya aka n’obi n’ihi ihe igurube ndị ahụ mebiri. Mgbe e mechara, Chineke ga-awụkwasị ha mmụọ ya. Ihe ndị a mezuru mgbe ndị Babịlọn busoro ndị Izrel agha na mgbe e mechara. Mkpughe 9:1-11 kwuru banyere igurube, ya bụ, ndị e tere mmanụ nọ n’oge anyị a, ndị na-ezi ndị mmadụ ozi banyere ikpe a mara ụwa Setan. Ozi a na-eme ka iwe na-ewe ndị na-akwado ụwa Setan.—w20.04, peeji nke 3 ruo na nke 6.

Ònye bụ eze ugwu taa?

Ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya. Ha amachiela ọrụ ikwusa ozi ọma ndị Chineke na-arụ, na-akpagbu ha, kpọọkwa ha asị. Eze ugwu na eze ndịda na-ama aka kemgbe.—w20.05, peeji nke 13.

Ihe itoolu e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 5:22, 23 hà bụ ihe niile so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?

Mba. Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma ndị ọzọ dị ka ime ezi omume. (Efe. 5:8, 9)—w20.06, peeji nke 17.

Olee otu ọghọm dị n’itinye ihe banyere onwe gị n’Ịntanet?

Ihe i tinyere n’Ịntanet nwere ike ime ka ndị ọzọ chewe na ị dịghị umeala n’obi, kama, na ị na-etu ọnụ banyere onwe gị.—w20.07, peeji nke 6 ruo na nke 7.

Gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ịmụta n’aka ndị bụ́ aka ochie n’ịkụ azụ̀?

Ha na-aga egbu azụ̀ n’ebe azụ̀ juru nakwa n’oge ha ga-akacha egbuta azụ̀. Ha ma otú e si eji ngwá ọrụ ha arụ ọrụ nke ọma. Ha na-ejikwa obi ike arụ ọrụ ha n’agbanyeghị otú ihu ígwé dị. Anyị kwesịkwara ịna-eme otu ihe ahụ n’ozi anyị.—w20.09, peeji nke 5.

Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi mee ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl hụkwuo Jehova n’anya?

Anyị nwere ike ịgwa ha ka ha na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe ha mụtara. Anyị nwekwara ike ịkụziri ha ikpe ekpere.—w20.11, peeji nke 4.

Mgbe Baịbụl sịrị: “A ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst,” olee ndị so ná mmadụ niile ahụ?—1 Kọr. 15:22.

Ihe Pọl onyeozi na-ekwu abụghị na a ga-akpọlite mmadụ niile n’ọnwụ. Ndị ọ na-ekwu banyere ha n’ebe a bụ ndị e tere mmanụ, ya bụ, ndị “e doro nsọ n’ime Kraịst Jizọs.” (1 Kọr. 1:2; 15:18)—w20.12, peeji nke 5 ruo na nke 6.

Gịnị ka ndị e tere mmanụ ga-eme mgbe ‘a ga-agbanwe ha n’otu ntabi anya n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ’?—1 Kọr. 15:51-53.

Ha ga-eso Kraịst jiri mkpanaka ígwè zụọ ndị mmadụ dị ka atụrụ. (Mkpu. 2:26, 27)—w20.12, peeji nke 12 ruo na nke 13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya