Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Ọktoba p. 29-31
  • 1921—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1921—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ATỤGHỊ ỤJỌ
  • ỊMỤ IHE NA OFUFE EZINỤLỌ
  • AKWỤKWỌ ỌHỤRỤ
  • ỌRỤ A GA-ARỤ
  • Jehova Na-agọzi Ndị Na-eme Uche Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • 1922​—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ihe Ndị Ga-ewetara Anyị Obi Ụtọ Ma Anyị Họrọ Ime Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Otú Ọgbọ Asaa n’Ezinụlọ Anyị Sirila Fee Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Ọktoba p. 29-31

1921—Ihe Ndị Mere Otu Narị afọ Gara aga

N’ỤLỌ NCHE January 1, 1921, a jụrụ Ndị Mmụta Baịbụl, sị: “Olee ọrụ anyị na-atụ anya ịrụ n’afọ a?” Iji zaa ajụjụ ahụ, Ụlọ Nche ahụ kwuru ihe dị n’Aịzaya 61:​1, 2, ebe chetaara ha na e nyere ha ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “Jehova tere m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma. . . . Ka m kwusaa afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara na ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.”

NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ATỤGHỊ ỤJỌ

Iji nwee ike ịrụ ọrụ a nke ọma, Ndị Mmụta Baịbụl ga-abụ ndị na-anaghị atụ ụjọ. Ha ga-ekwusara ndị dị umeala n’obi “ozi ọma,” kwusaakwara ndị ajọ omume “ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.”

Nwanna J. H. Hoskin bi na Kanada kwusara ozi ọma n’atụghị ụjọ n’agbanyeghị mkpagbu. N’ihe dị ka n’ọnwa Eprel afọ 1921, o zutere otu onye ụkọchukwu chọọchị Metọdist. Nwanna Hoskin sịrị ya, “Anyị kwesịrị iji obiọma kwurịta ihe dị na Baịbụl. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ụfọdụ anyị na-ekwekọrịtaghị na ya, o kwesịghị ime ka anyị gharazie ịbụ enyi.” Ma ihe ahụ o kwuru emezughị. Nwanna Hoskin kwuru, sị: “Obere oge mụ na ụkọchukwu ahụ kwuru okwu, o ji iwe kwachie ụzọ nke mere ka m chee na ugegbe dị n’ụzọ ahụ ga-akụwa.”

Ụkọchukwu ahụ ji iwe jụọ m, sị: “Gịnị mere ị gaghị agakwuru ndị na-abụghị Ndị Kraịst zie ha ozi ọma.” Nwanna Hoskin gbara ya nkịtị. Ma, ka Nwanna Hoskin na-apụ, ọ sịrị n’obi ya: “Ọ dịdị ka ị̀ bụ otu n’ime ha.”

N’echi ya, mgbe ụkọchukwu ahụ na-ekwu okwuchukwu ya, ọ nọgidere na-akatọ nwanna ahụ. Nwanna Hoskin kwuru, sị: “Ọ gwara ndị chọọchị ya na m bụ ezigbo onye ụgha e kwesịrị igbu egbu.” Ma ihe a emeghị ka Nwanna Hoskin tụọ ụjọ. Ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma. Ihe gazikwaara ya. Ọ sịrị: “Ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Ụfọdụ ndị ebe ahụ kwuru sị, ‘Anyị ma na ị bụ onye nke Chineke.’ Ha kwukwara na ha ga-enye m ihe ọ bụla dị m mkpa.”

ỊMỤ IHE NA OFUFE EZINỤLỌ

Iji nyere ndị nwere mmasị aka ka ha nọgide na-eme nke ọma, Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara ihe ndị ha ga-eji na-amụ Baịbụl n’akwụkwọ bụ́ The Golden Age.a E nwere ajụjụ ndị nne na nna ga-eji na-akụziri ụmụ ha ihe n’akwụkwọ ahụ. Ndị nne na nna “ga-ajụ ụmụ ha ajụjụ ndị a ma nyere ha aka ịchọta ebe azịza ya dị na Baịbụl.” Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ bụ, “Akwụkwọ ole ka e nwere na Baịbụl?” Ụdị ajụjụ ndị a ga-akụziri ha eziokwu ndị na-ataghị akpụ gbasara Baịbụl. Ajụjụ ndị ọzọ dị ka, “Onye Kraịst ò kwesịrị ịtụ anya na e nwere ike ịkpagbu ya?” na-akwadebe ụmụaka ndị ahụ ịbụ ndị nkwusa na-anaghị atụ ụjọ.

E nwekwara ajụjụ ndị ọzọ gbasara Baịbụl ga-enyere Ndị Mmụta Baịbụl aka. E nwekwara ike ịchọta azịza ha na mpịakọta nke mbụ nke akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures. Ihe a baara ọtụtụ puku ndị na-agụ ya uru. Ma, The Golden Age nke December 21, 1921, kwuru na a ga-akwụsị ibipụta ajụjụ na azịza ndị a. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

AKWỤKWỌ ỌHỤRỤ

Akwụkwọ The Harp of God

Kaadị e ji agụ akwụkwọ The Harp of God

Kaadị ahụ e dere ajụjụ

Ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Jehova chọpụtara na ndị malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ kwesịrị inwe ụzọ a haziri ahazi ha ga-esi na-amụ ihe ndị na-ataghị akpụ dị na Baịbụl. N’ihi ya, ha wepụtara akwụkwọ bụ́ The Harp of God na Nọvemba afọ 1921. A na-edeba aha ndị nwere mmasị natara akwụkwọ a n’akwụkwọ ka ha nwee ike iji ya na-amụ Baịbụl n’onwe ha. Ịmụ akwụkwọ a ga-enyere ha aka ịmata otú Chineke ga-esi eme ka ụmụ mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. Olee otú ha ga-esi na-amụ ya?

Ọ bụrụ na mmadụ anata akwụkwọ ahụ, a ga-enye ya obere kaadị e dere ebe ọ ga-agụ. N’izu na-eso ya, a ga-enye ya kaadị ọzọ e dere ajụjụ ndị ọ ga-eji ihe ọ gụrụ zaa. Ná ngwụcha kaadị ahụ, ọ ga-ahụ ihe ndị ọ ga-agụ n’izu na-esonụ.

Kwa izu, ruo izu iri na abụọ, ndị ọgbakọ nọ ebe onye ahụ bi na-ezigara ya kaadị ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-ezite kaadị ahụ bụ ụmụnna katarala ahụ́ ma ọ bụkwanụ ndị na-anaghị agali ozi ụlọ n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anna K. Gardner bi na Milvale, Pensụlvenịa, dị n’Amerịka kwuru, sị: “Mgbe e wepụtara akwụkwọ The Harp of God, o mere ka nwanne m nwaanyị ọ na-esiri ike ịga ije aha ya bụ Thayle nwekwuo ihe ọ ga na-eme. Ọ na-ezigara ndị mmadụ kaadị ahụ e dere ajụjụ na ya kwa izu.” Ọ bụrụ na onye ahụ agụchaa akwụkwọ ahụ, ndị nkwusa na-aga na nke ya iji nyere ya aka ịmụtakwu ihe ndị ọzọ na Baịbụl.

Ebe Nwanna Nwaanyị Thayle Gardner nọ n’ígwè ndị ngwọrọ

ỌRỤ A GA-ARỤ

Ná ngwụcha afọ ahụ, Nwanna J. F. Rutherford zigaara ọgbakọ niile akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara ha na “otú e si kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe n’afọ ahụ nakwa otú o si nyere ndị mmadụ aka karịrị nke afọ ndị gara aga.” O kwukwara, sị: “Ihe a ka ga-arụ ka buru nnọọ ezigbo ibu. Gbaanụ ndị ọzọ ume ka ha tinye aka iji hụ na ozi ọma a na-aga n’ihu.” O doro anya na ndị mmụta Baịbụl mere ihe a o kwuru. Ha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’atụghị ụjọ n’afọ 1922 karịa otú ha metụrụla mbụ.

Ndị Enyi Na-anaghị Atụ Ụjọ

Ndị Mmụta Baịbụl na-enyere ibe ha aka iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Akụkọ anyị ga-akọ ugbu a gosiri na ha bụ ndị enyi na-anaghị atụ ụjọ “na-enyere enyi [ha] aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Na Tuzdee, abalị iri atọ na otu n’ọnwa Mee afọ 1921, ọgba aghara dara na Tulsa, Oklahoma dị n’Amerịka n’ihi na a tụrụ otu nwoke onye isi ojii mkpọrọ. E boro ya ebubo na ọ wakporo otu nwaanyị onye ọcha. Ihe a kpọrọ ọgba aghara ahụ bụ Tulsa Race Massacre. Mgbe ụmụ nwoke ndị ọcha karịrị otu puku na ụmụ nwoke ndị isi ojii na-aharughị otú ahụ malitere ịlụ ọgụ n’ebe ndị isi ojii bi na Greenwood, a gbara ụlọ na ebe a na-azụ ahịa karịrị otu puku na narị anọ ọkụ, bukọrọkwa ngwongwo dị na ha. Ndị ọchịchị sịrị na ndị nwụrụ n’ọgba aghara ahụ dị iri atọ na isii. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịbụ na ndị nwụrụ na ya dị ọtụtụ narị.

E nwere otu nwanna onye isi ojii aha ya bụ Richard J. Hill bụ́ Onye Mmụta Baịbụl bi na Greenwood kọrọ ihe merenụ. Ọ sịrị: “N’abalị ahụ ọgba aghara malitere, anyị gara ọmụmụ ihe otú anyị na-emebu. Mgbe anyị gbasara, anyị nụrụ ụda égbè na Tulsa. Ọ nọkwa na-ada ruo mgbe anyị labara ụra.” Mgbe ọ na-erula ụtụtụ Wenezdee, abalị mbụ n’ọnwa Jun, ihe akala njọ. Nwanna ahụ kwukwara, sị: “Ndị ụfọdụ bịara gwa anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a ghara imerụ anyị ahụ́, ọ ga-aka mma ka anyị gbaga n’ụlọ ezumeezu ndị gọọmenti dị n’obodo ahụ.” N’ihi ya, Nwanna Hill na nwunye ya na ụmụ ya ise gbagara ebe ahụ. Ihe dị ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị isi ojii ruru puku atọ gbakọrọ n’ebe ahụ. Ndị amị gọọmenti zitere nọkwa na-eche ha nche.

N’otu oge ahụkwa, Nwanna Arthur Claus bụ́ onye ọcha mere mkpebi gosiri na o nwere obi ike. Ọ sịrị: “Mgbe m nụrụ na ndị na-eme ọgba aghara ahụ na-agbagharị Greenwood niile, na-agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ, na-ebukọrọkwa ngwongwo ha, m kpebiri ịga hụ otú Nwanna Hill bụ́ ezigbo enyi m mere.”

Nwanna Arthur Claus ji akwụkwọ The Harp of God kụziere ụmụaka iri na anọ ihe

Mgbe o rutere n’ụlọ Nwanna Hill, ọ hụrụ otu onye agbata obi Nwanna Hill bụ́ onye ọcha ka o bu égbè. Ọ bụ enyi Nwanna Hill. O chere na Nwanna Arthur so ná ndị ahụ na-eme ọgba aghara, ya ajụọ ya, sị: “Gịnị ka ị na-eme n’ụlọ nwoke a?”

Nwanna Arthur sịrị: “A sị na mụ azaghị ya ihe juru ya afọ mgbe ahụ, ọ gaara agba m égbè. M gwara ya na Nwanna Hill bụ enyi m, nakwa na abịala m n’ụlọ ya ọtụtụ ugboro.” Nwanna Arthur na onye agbata obi Nwanna Hill ahụ chebere ụlọ Nwanna Hill ka ndị ahụ na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ ghara ịba na ya.

O teghị aka, Nwanna Arthur achọpụta na Nwanna Hill na ndị ezinụlọ ya gbagara n’ụlọ ezumeezu ndị gọọmenti. A gwara Nwanna Arthur na e nweghị onye isi ojii ga-esi ebe ahụ pụọ, ọ gwụla ma a natara akwụkwọ ikike n’aka General Barrett bụ́ onye na-elekọta ebe ahụ. Nwanna Arthur sịrị: “O siiri m ike ịhụ General Barrett. Mgbe m gwara ya na m ga-achọ ịkpọpụ Nwanna Hill na ndị ezinụlọ ya ebe ahụ, ọ jụrụ m, sị: ‘Ị̀ ga-enwe ike ichebeli ha ma gbooro ha mkpa ha?’ M ji obi ụtọ sị ya ee.”

Nwanna Arthur ji akwụkwọ ikike o nwetara gbaga n’ụlọ ezumeezu ahụ. Mgbe o gosiri ya onye amị nọ ebe ahụ, ya etie, sị: “Ọ bụkwa general n’onwe ya bịanyere aka n’akwụkwọ a. Ị̀ ma na ọ bụ gị bụ onye mbụ na-akpọpụ mmadụ ebe a taa?” Ọ raghị ahụ́ ha achọta ebe Nwanna Hill na ndị ezinụlọ ya nọ, ha niile abanye n’ụgbọala Nwanna Arthur lawa n’ụlọ ha.

“N’etiti ndị Chineke, o nweghị onye ka ibe ya”

Nwanna Arthur gbalịsiri ike hụ na o chebere Nwanna Hill na ezinụlọ ya. Mgbe ụmụnna ndị ọzọ hụrụ ụdị obi ike Nwanna Arthur nwere, obi tọrọ ha ụtọ. Nwanna Arthur sịrị: “Onye agbata obi Nwanna Hill ahụ nyere aka chebe ụlọ ya mechara nwee mmasị n’ozi ọma anyị, ọtụtụ ndị enweekwa mmasị n’ihi na ha hụrụ na anyị anaghị akpa ókè agbụrụ, nakwa na n’etiti ndị Chineke, o nweghị onye ka ibe ya.”

a N’afọ 1937, a gbanwere aha The Golden Age ka ọ bụrụ Consolation, malitekwa ịkpọ ya Awake! n’afọ 1946.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya