Foto a nọ n’ebe dị ezigbo nso n’ebe ahụ a na-ekwu okwu see nakwa ihe ahụ e kowere n’elu ya
1922 Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara aga
ISIOKWU afọ 1922 bụ: “Chineke . . . ji Onyenwe anyị Jizọs Kraịst enyere anyị aka imeri.” (1 Kọr. 15:57) Isiokwu a chetaara Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ na Chineke ga-agọzi ha maka irubere ya isi. Jehova gọzikwara ha n’afọ ahụ. Ọ gọziri ha mgbe ha malitere ibi akwụkwọ nke ha na ikwe ya, ha amalitekwa iji redio ekwusa ozi ọma Alaeze. Ka oge na-aga n’afọ 1922, o dokwara anya na Jehova na-agọzi ndị ya. Ndị Mmụta Baịbụl nwere mgbakọ pụrụ iche na Sida Pọịnt Ohayo dị n’Amerịka. Ihe mere ná mgbakọ ahụ ka baara nzukọ Jehova uru n’ọrụ ha na-arụ ruo taa.
“ECHICHE MAGBURU ONWE YA”
Ka ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma, a chọwakwuru akwụkwọ e ji ekwusa ozi ọma. N’oge ahụ, ụmụnna na-arụ na Betel dị na Bruklin na-ebipụta magazin, ma, ọ ka bụ ụlọ ọrụ a na-akwụ ụgwọ na-ebipụta akwụkwọ ndị nke mkpo ha siri ike. E nwere mgbe ụlọ ọrụ ahụ na-ebipụtaghị akwụkwọ zuru ikwusa ozi ọma ruo ọtụtụ ọnwa. N’ihi ya, Nwanna Rutherford jụrụ Nwanna Robert Martin, bụ́ onye na-elekọta ọrụ ibipụta akwụkwọ, ma ò chere na ha nwere ike ịna-ebipụta akwụkwọ ndị nke mkpo ha siri ike.
Ebe ahụ anyị na-ebipụta akwụkwọ na Concord Street dị na Bruklin
Mgbe Nwanna Martin na-ekwu gbasara ihe ahụ Nwanna Rutherford chere, ọ sịrị: “Echiche ya ahụ magburu onwe ya n’ihi na ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-arụ ebe a ga-anọ na-ebi akwụkwọ ndị mkpo ha siri ike.” Ụmụnna ndị ahụ chọtara ebe ha ga-arụ ya na nọmba 18 Concord Street dị na Bruklin, zụtakwa ngwá ọrụ ndị dị mkpa.
Ọ bụghị mmadụ niile ka ihe a dị mma n’obi. Onyeisi ụlọ ọrụ na-ebiburu anyị akwụkwọ bịara ka ọ hụ ebe ahụ. Ọ sịrị: “Unu nwere ihe ndị bụ́ ọkpọka e ji ebi akwụkwọ ebe a, mana e nweghị onye n’ime unu ma otú e si eji ha arụ ọrụ. Unu ga-emebicha ha tupu ọnwa isii agaa.”
Nwanna Martin kwuru, sị: “Ihe ahụ o kwuru yiri ihe nwere ike ime, ma anyị ma na Onyenwe anyị ga-enyere anyị aka. O nyekwaara anyị aka.” Ihe ahụ Nwanna Martin kwuru bụ eziokwu. Ọ dịghị anya, a malite ibi akwụkwọ ruru puku abụọ (2,000) n’ebe ahụ kwa ụbọchị.
Ebe ndị ji ígwè na-ebi akwụkwọ kwụ n’akụkụ ya n’ebe anyị na-ebi akwụkwọ
IJI REDIO EZI ỌTỤTỤ PUKU MMADỤ OZI ỌMA
E wezụga iji aka ha na-ebi ụfọdụ akwụkwọ ha, ndị Jehova malitekwara isi ụzọ ọzọ na-ekwusa ozi ọma, ya bụ, isi na redio ekwusa ya. Ọ bụ n’ehihie Sọnde, abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Febụwarị afọ 1922 ka Nwanna Rutherford kwuru okwu mbụ ya na redio. Isiokwu ya bụ: “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” O kwuru ya n’ụlọ ọrụ redio aha ya bụ KOG dị na Lọs Anjelis, dị na Kalịfọnịa, Amerịka.
Ihe dị ka puku mmadụ iri abụọ na ise (25,000) gere okwu ahụ. Ụfọdụ n’ime ha detara akwụkwọ ozi kelee Nwanna Rutherford maka okwu ahụ. Otu n’ime ndị detara akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ Nwanna Willard Ashford bi na Santa Ana, dị na Kalịfọnịa. Ọ jara Nwanna Rutherford mma maka okwu ya tọrọ ndị mmadụ ezigbo ụtọ. Ọ sịrị: “E nwere mmadụ atọ ahụ́ na-adịghị n’ezinụlọ m. N’ihi ya, o nweghị onye n’ime anyị gaara agali gee okwu a, ọ bụrụgodị na ebe a ga-anọ kwuo ya adịghị anya n’ụlọ anyị. Naanị ihe mere anyị ji gee ya bụ na ọ bụ na redio ka e kwuru ya.”
E kwuru okwu ndị ọzọ na redio n’izu ndị na-eso ya. Ná ngwụcha afọ ahụ, Ụlọ Nche kwuru na “ọ dịkarịa ala, narị puku mmadụ atọ (300,000) egeela ozi ọma na redio.”
Ihe ndị mmadụ kwuru nakwa akwụkwọ ozi ha detara gbara Ndị Mmụta Baịbụl ume, mee ka ha kpebie ịrụ ụlọ ọrụ redio na Staten Aịland, n’ebe dị nso na Betel dị na Bruklin. N’afọ ndị sochiri ya, Ndị Mmụta Baịbụl ga-esi n’ụlọ ọrụ redio aha ya bụ WBBR mee ka ọtụtụ ndị n’ọtụtụ obodo nụ ozi ọma Alaeze.
“ADV”
Ụlọ Nche Bekee nke Jun 15, 1922, kwuru na a ga-enwe mgbakọ na Sida Pọịnt Ohayo malite n’abalị ise ruo n’abalị iri na atọ n’ọnwa Septemba, afọ 1922. Obi dị Ndị Mmụta Baịbụl ezigbo ụtọ mgbe ha rutere Sida Pọịnt.
Mgbe Nwanna Rutherford na-ekwu okwu mmeghe ya, ọ gwara ndị bịara mgbakọ ahụ, sị: “O doro m ezigbo anya na Onyenwe anyị . . . ga-agọzi mgbakọ a ma mee ka e kwusaa ozi ọma karịa otú e kwusatụrụla ya n’ụwa.” Ndị kwuru okwu ná mgbakọ ahụ gbara ụmụnna ume ka ha na-ekwusa ozi ọma.
Ìgwè mmadụ bịara mgbakọ na Sida Pọịnt, dị n’Ohayo n’afọ 1922
Na Fraịdee, abalị asatọ n’ọnwa Septemba, ihe dị ka puku mmadụ asatọ (8,000) zukọrọ n’ebe ha mere mgbakọ ahụ, na-atụsi anya ike mgbe Nwanna Rutherford ga-ekwu okwu. Ha na-atụ anya na ọ ga-akọwara ha ihe “ADV” e dere n’akwụkwọ ikpo òkù mgbakọ ahụ pụtara. Ka ha nọdụrụ ala, ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ha hụrụ nnukwu ákwà a fụkọtara afụkọta ma konye ya n’elu ebe ahụ a na-ekwu okwu. Nwanna Arthur Claus si Tọlsa, dị n’Ọklahoma dị n’Amerịka, gaa mgbakọ ahụ. O nwetara oche n’ebe ọ ga na-anụ ihe niile a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ. Ọ na-esi ike inweta ụdị ebe ahụ n’oge ahụ n’ihi na e nwebeghị maịkrofon ga-eme ka a na-anụ ihe a na-ekwu nke ọma.
“Anyị nọ na-ege ntị nke ọma n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.”
Onyeisi oche mara ọkwa na a gaghị ekwe ka ndị ọ bụla na-abịaghị n’oge bata n’ụlọ mgbakọ ahụ ma Nwanna Rutherford kwuwe okwu ka ha ghara ime ka uche ndị mmadụ pụọ n’ihe a na-ekwu. Mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ, Nwanna Rutherford ji ihe e dere na Matiu 4:17 malite okwu ya. N’ebe ahụ, Jizọs sịrị: “Alaeze eluigwe adịla nso.” Mgbe ọ nọ na-akọwa otú ndị mmadụ ga-esi nụ gbasara Alaeze ahụ, ọ sịrị: “Jizọs kwuru na mgbe a ga-eme ya Eze n’eluigwe, ọ ga-achịkọta ndị ya. Ọ bụ n’oge ahụ ka ọ ga-achịkọta ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.”
Nwanna Claus, bụ́ onye nọ ebe ahụ, chetara ihe mere ụbọchị ahụ. Ọ sịrị: “Anyị nọ na-ege ntị nke ọma n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.” Ma, na mberede, ọrịa bịara Nwanna Claus, ya adị mkpa ka ọ pụọ n’èzí. O wutere ya mgbe ọ na-apụ n’ihi na ọ ma na a gaghịzi ekwe ya bata ọzọ.
Mgbe nkeji ole na ole gachara, ahụ́ ya katụrụ mma. O kwuru na mgbe ọ chọrọ ịbanyeghachi ebe ahụ, ọ nụrụ ka mmadụ niile na-akụ aka. Ihe ahụ mere ka ọ chọsiwe ike ịbanye ebe ahụ. O kpebiri na ọ ga-egetọpụ okwu ahụ tọgburu onwe ya ọ bụrụgodị na ọ ga-arịgo n’elu ụlọ gee ya. N’oge ahụ, Nwanna Claus dị afọ iri abụọ na atọ. Ọ chọtara otú ọ ga-esi rịgoo n’elu ụlọ ahụ. E nwere ebe ghe oghe n’elu ụlọ ahụ. Mgbe ọ na-eru ebe ahụ nso, ọ sịrị na ọ na-anụ ihe ahụ a na-ekwu nke ọma.
Ma, ọ bụghị naanị Nwanna Arthur nọ ebe ahụ. Ụfọdụ ndị enyi ya nọkwa n’elu ebe ahụ. Otu n’ime ha aha ya bụ Frank Johnson gakwuuru ya, sị ya: “Ì nwere obere mma dị nkọ n’akpa gị?”
Nwanna Arthur sịrị ya: “Ee. Eji m.”
Nwanna Frank asị ya: “Chineke ji gị za ekpere anyị. Ị hụrụ nnukwu ákwà a e kegidere ebe a? E dere ihe na ya, jirikwa ntu ndị a jide ya. Gewe Ọkàikpe ntị nke ọma.a Ọ bụru na ọ sị, ‘Kpọsaanụ, kpọsaanụ,’ gị achabie ụdọ anọ ndị a.”
N’ihi ya, Nwanna Arthur ji mma, ya na ndị enyi ya ana-eche ka Nwanna Rutherford kwuo ihe ahụ. O teghị aka, Nwanna Rutherford eruo n’ebe kacha mkpa n’okwu ya. Nwanna Rutherford ji obi ụtọ na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu ahụ. O nwere ike ịbụ na ọ na-eti mkpu mgbe ọ sịrị: “Bụrụnụ ezi ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị. Gaanụ n’ihu n’agha ahụ ruo mgbe e bibiri Babịlọn kpamkpam. Kpọsaanụ ozi ahụ n’ebe niile. A ga-emerịrị ka ụwa mata na Jehova bụ Chineke nakwa na Jizọs Kraịst bụ Eze ndị eze na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile. Taa bụ ụbọchị kacha ụbọchị niile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya.”
Nwanna Arthur kwuru na mgbe ya na ụmụnna ndị ọzọ chabiri ụdọ ndị ahụ, ákwà ahụ e dere ihe na ya meghere nke ọma. Ihe e dere na ya bụ “Kpọsaanụ Eze Ahụ na Alaeze Ya.” “ADV” ahụ bụ ndebiri okwu Bekee pụtara ‘kpọsaa’ ma ọ bụ ‘kwusaa.’
ỌRỤ DỊ MKPA
Mgbakọ ahụ e mere na Sida Pọịnt nyeere ụmụnna aka ka ha lekwasị anya n’ọrụ kacha mkpa, ya bụ, ikwusa ozi ọma Alaeze. Ikwusa ozi ọma tọkwara ndị chọrọ ime ya ezigbo ụtọ. E nwere otu onye kọpọtụa si Ọklahoma dị n’Amerịka. (Ihe a na-akpọzi onye kọpọtụa bụ onye ọsụ ụzọ). O dere, sị: “Ebe anyị kwusara ozi ọma bụ n’ebe ọtụtụ ndị bi na ya na-egwu kol. Ha bụkwa ogbenye ọnụ ntụ.” O kwuru na ọtụtụ mgbe, ha nụ ozi ọma e dere na magazin a na-akpọ Golden Age n’oge ahụ, “anya mmiri na-amalite gbawa ha.” Ọ sịrị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị gbara ha ume.”
Ndị Mmụta Baịbụl ndị a ma otú ihe Jizọs kwuru na Luk 10:2 dịruru ná mkpa. Ebe ahụ sịrị: “Ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” Ka afọ ahụ na-agwụ, ha kpebisikwuru ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ikwusa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.
a Mgbe ụfọdụ a na-akpọ Nwanna Rutherford “Ọkàikpe” n’ihi na e nwere mgbe ụfọdụ ọ bụ ọkàikpe pụrụ iche na Mizuri dị n’Amerịka.