Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Febụwarị p. 31
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Ma Ihe Anyị Ga-emeli
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ịchụ Àjà Ndị Na-amasị Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Febụwarị p. 31

Ị̀ Maara?

Gịnị mere o ji dị mma na e nwere ike iji nduru ma ọ bụ kpalakwukwu chụọrọ Jehova àjà n’Izrel oge ochie?

IWU Mosis kwuru na e nwere ike iji nduru ma ọ bụ kpalakwukwu chụọrọ Jehova àjà. N’iwu e nyere ụmụ Izrel gbasara ịchụ àjà, mgbe ọ bụla e kwuru gbasara nduru, a na-ekwukwa gbasara kpalakwukwu. Ọ bụrụ na i jighị nke a chụọ àjà, i nwekwara ike iji nwanne ya. (Lev. 1:14; 12:8; 14:30) Gịnị mere o ji dị mma? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka nduru na-adị n’Izrel. N’ihi gịnị?

Nduru

Nduru na-adị n’Izrel niile n’oge okpomọkụ. N’ọnwa Ọktoba ọ bụla, ha na-efega n’obodo ndị na-ekpo ọkụ ma lọghachi n’Izrel n’ihe dị ka n’ọnwa Eprel. (Abụ Solo. 2:​11, 12; Jere. 8:7) Ihe ọ putara bụ na ọ ga-esiri ndị Izrel ike inweta nduru ha ga-eji chụọ àjà n’oge oyi.

Kpalakwukwu

Ma, kpalakwukwu anaghị aga ebe ọ bụla. Ọ na-adị n’Izrel mgbe ọ bụla n’afọ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị Izrel na-akpa kpalakwukwu. (Tụlee Jọn 2:​14, 16.a) Akwụkwọ aha ya bụ Bible Plants and Animals kwuru, sị: “A na-akpa kpalakwukwu n’obodo niile dị na Palestaịn. Onye ọ bụla nwe ụlọ na-arụnye akwụ́, ma ọ bụ oghere, n’ahụ́ ụlọ ya ebe nduru ga-ebi.”​—Tụlee Aịzaya 60:8.

Kpalakwukwu nọ n’akwụ́ ya

Otú a Jehova si kwe ka ndị Izrel jiri nnụnụ ndị ha ga-enwetali mgbe ọ bụla n’afọ na-achụrụ ya àjà gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, na-echebakwara ha echiche.

a “Nduru” e kwuru maka ya na Jọn 2:​14, 16 nwekwara ike ịbụ “kpalakwukwu.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya