Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Febụwarị p. 31
  • Ha Hụrụ Otú Ụmụnna Si Hụ Ha n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Hụrụ Otú Ụmụnna Si Hụ Ha n’Anya
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu Na-ewetara Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Ìsì Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • A Zara Ekpere Otu Nwaanyị Kpuru Ìsì
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Febụwarị p. 31

[malite n’aka ekpe gaa n’aka nri] Marcelo, Yomara, na Hiver. Ha niile ji Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ Spanish

Ha Hụrụ Otú Ụmụnna Si Hụ Ha n’Anya

OTU nwaanyị aha ya bụ Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke aha ha bụ Marcelo na Hiver bi n’otu obere obodo dị na Gụatemala. Yomara na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ụmụnne ya ndị nwoke mechakwara soro ya mụwa Baịbụl. Ma, e nwere otu nsogbu dịnụ. Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ahụ kpuru ìsì. Ha anaghịkwanụ agụli ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. N’ihi ya, onye na-amụrụ ha Baịbụl na-agụpụtara ha ihe ha na-amụ na amaokwu Baịbụl ndị dị na ya.

Ịga ọmụmụ ihe anaghị adịrị ha mfe. Ha agaghị agali Ụlọ Nzukọ Alaeze n’onwe ha. Ọ ga-ewe ha nkeji iri anọ ịgaru Ụlọ Nzukọ Alaeze kacha dịrị ha nso. Ma, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha haziri ka ha na-akpọ ha aga ọmụmụ ihe niile. Mgbe ụmụnne ya ndị nwoke malitere ime ihe omume ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ ihe etiti izu, ụmụnna na-enyere ha aka ibute ihe omume ha n’isi.

N’ọnwa Mee afọ 2019, a malitere inwe ọmụmụ ihe n’obodo ha. N’oge ahụ, e nwere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ oge niile kwatara n’ododo ha. Ha kpebiri ịkụziri Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ahụ otú e si agụ na otú e si ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ọ bụ eziokwu na hanwa amaghị ya. N’ihi ya, ha gara n’otu ọ́bá akwụkwọ nweta akwụkwọ ndị kwuru otú e si akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.

Ebe Marcelo na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe

N’ime ọnwa ole na ole, ụmụnne atọ ahụ malitere ịgụ ihe e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Ihe a mekwara ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ.a Ugbu a, Yomara, Marcelo, na Hiver bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Marcelo bụ ohu na-eje ozi. Ha na-eji ọrụ gbasara ofufe Jehova n’aka mgbe niile. Otú ha si anụ ọkụ n’obi na-emekwa ka ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi.

Obi dị Yomara na ụmụnne ya abụọ ụtọ maka otú ụmụnna si enyere ha aka. Yomara sịrị: “Malite n’ụbọchị mbụ anyị matara Ndịàmà Jehova, ha na-egosi anyị na ha hụrụ anyị n’anya.” Marcelo sịrị: “Anyị nwere ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ. Anyị sokwa n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ hụrụ ibe ha n’anya.” Yomara na ụmụnne ya ndị nwoke na-atụ anya mgbe ha ga-eji anya ha hụ ka e mere ka ụwa ghọọ paradaịs.​—Ọma 37:10, 11; Aịza. 35:5.

a E nwere otu broshọ aha ya bụ Learn to Read Braille. Ihe mere e ji wepụta akwụkwọ ahụ bụ ka o nyere ndị ìsì na ndị na-anaghị ahụcha ụzọ aka ịmụta otú e si agụ mkpụru akwụkwọ ndị ìsì.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya