Isiokwu Ndị Ọzọ Na-agba n’Ụlọ Nche
Ọtụtụ ụmụnna na-eji JW Library® akwadebe ọmụmụ ihe. Obi na-adịkwa ha ụtọ maka otú o si ebuga ha n’isiokwu Ụlọ Nche a ga-amụ. Ma, isiokwu ndị ọzọ na-adịkarị n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ. Isiokwu ndị ahụ so n’ihe ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Olee otú ị ga-esi achọta isiokwu ndị ahụ na JW Library ma gụọ ha?
Ná ngwụcha isiokwu ọ bụla a na-amụ amụ, a na-enwe isiokwu nta bụ́ “Isiokwu Ndị Ọzọ.” N’okpuru ya, pịa ebe e dere “Isiokwu niile dị na magazin a.” Ị ga-ahụ isiokwu niile gbara n’Ụlọ Nche ahụ. E mere ka isiokwu ndị a na-amụ amụ doo anya, deekwa nọmba ha. Pịa nke ọ bụla n’ime isiokwu ndị ọzọ gbara n’Ụlọ Nche ahụ ị ga-achọ ịgụ.
N’isimbido JW Library, gaa ebe e dere “Ihe Ọhụrụ,” were Ụlọ Nche ọhụrụ ọ bụla pụtara. I mepee nke ahụ i weere, gaa n’ebe e dere isiokwu ndị dị na ya ka i nwee ike irite uru n’isiokwu niile dị n’Ụlọ Nche ahụ.