Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Julaị p. 8-13
  • Ị̀ Na-achọpụtali nke Bụ́ Eziokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-achọpụtali nke Bụ́ Eziokwu?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ÀGWÀ NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊCHỌPỤTA NKE BỤ́ EZIOKWU
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI JISIE EZIOKWU IKE
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Ụmụ Nwoke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Kwuru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Tụkwasịkwuo Nzukọ Jehova Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Julaị p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

Ị̀ Na-achọpụtali nke Bụ́ Eziokwu?

“Kwụrụnụ chịm, werenụ eziokwu kee úkwù unu.” ​—EFE. 6:14.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị ga-esi azụ onwe anyị ka anyị mata ihe dị iche n’eziokwu Jehova kụziiri anyị na ụgha Ekwensu na ndị na-emegide anyị na-akụzi.

1. Olee otú obi na-adị gị gbasara eziokwu?

NDỊ Jehova ji eziokwu dị n’Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee okwukwe. (Rom 10:17) Anyị kwetara na Jehova hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst ka ọ bụrụ “ogidi na ihe na-akwado eziokwu.” (1 Tim. 3:15) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ‘irubere ndị na-eduzi anyị isi’ ka ha na-akụziri anyị eziokwu ndị dị na Baịbụl ma na-enye anyị ntụziaka ndị dabara n’uche Chineke.​—Hib. 13:17.

2. Dị ka e kwuru na Jems 5:19, olee ihe nwere ike ime anyị n’agbanyeghị na anyị amụtala eziokwu?

2 Ma, anyị kwetagodị eziokwu dị n’Okwu Chineke, kwetakwa na Jehova na-eji ọgbakọ ya enye anyị ntụziaka anyị ga-atụkwasịli obi, a ka nwere ike iduhie anyị. (Gụọ Jems 5:19.) Obi ga-atọgbu Setan atọgbu ime ka anyị kwụsị ịtụkwasị Baịbụl nakwa ntụziaka ndị nzukọ Jehova na-enye anyị obi.​—Efe. 4:14.

3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jisie eziokwu ike? (Ndị Efesọs 6:13, 14)

3 Gụọ Ndị Efesọs 6:13, 14. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu ga-eji ụgha yiri eziokwu duhie mba niile ka ha megidewe Jehova. (Mkpu. 16:13, 14) Anyị makwa na Setan ga-agbasikwu mbọ ike iduhie ndị Jehova. (Mkpu. 12:9) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị zụọ onwe anyị ka anyị na-achọpụta ihe dị iche n’eziokwu na ụgha nakwa ka anyị na-erubere eziokwu isi. (Rom 6:17; 1 Pita 1:22) Ihe a dị ezigbo mkpa ka e nwee ike ịzọpụta anyị n’oge oké mkpagbu.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’àgwà abụọ ga-enyere anyị aka ịchọpụta nke bụ́ eziokwu si n’Okwu Chineke ma nabata ntụziaka si ná nzukọ Jehova. Anyị ga-elebazi anya n’ihe atọ anyị ga-eme ka anyị nwee ike ijisi eziokwu ike.

ÀGWÀ NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊCHỌPỤTA NKE BỤ́ EZIOKWU

5. Olee otú ịtụ egwu Jehova si enyere anyị aka ịchọpụta nke bụ́ eziokwu?

5 Ịtụ egwu Jehova. Ọ bụrụ na anyị amụta ịtụ egwu Jehova otú kwesịrị ekwesị, anyị ga-ahụ ya n’anya nke na anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe. Ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịmata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ, na ihe dị iche n’eziokwu na ụgha, ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Jehova mma. (Ilu 2:3-6; Hib. 5:14) Anyị ekwesịghị ikwe ka egwu anyị na-atụ mmadụ karịa otú anyị si hụ Jehova n’anya n’ihi na ihe na-amasị ndị mmadụ na-abụkarị ihe na-anaghị amasị Jehova.

6. Olee otú ịtụ egwu mmadụ si mee ka ndị isi ndị Izrel iri ghara ikwu ihe bụ́ eziokwu?

6 Ọ bụrụ na anyị atụọ egwu mmadụ karịa otú anyị si atụ egwu Jehova, o nwere ike ime ka anyị hapụ eziokwu Jehova na-akụziri anyị. Ka anyị lee ihe ndị isi iri na abụọ ndị gara inyopụta ala Jehova kwere ụmụ Izrel ná nkwa mere. Mmadụ iri n’ime ha kwere ka egwu ha na-atụ ndị Kenan karịa otú ha si hụ Jehova n’anya. Ha gwara ndị Izrel ibe ha, sị: “Anyị agaghị alụsoli ndị obodo ahụ agha n’ihi na ha ka anyị ike.” (Ọnụ Ọgụ. 13:27-31) N’anya mmadụ, ndị Kenan siri ike karịa ndị Izrel. O doro ewu na ọkụkọ anya. Mana, mmadụ ikwu na ndị Izrel agaghị enwe ike imeri ndị iro ha gosiri na o nweghị okwukwe na Jehova. Mmadụ iri ahụ gaara elekwasị anya n’ihe Jehova chọrọ ka ndị Izrel mee. Ha kwesịkwara icheta ihe Jehova meere ha n’oge na-adịbeghị anya. Ọ ga-eme ka ha cheta na e nweghị ihe ndị Kenan bụ ma e jiri ha tụnyere Jehova Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Mana, Joshụa na Keleb emeghị ka mmadụ iri ahụ na-enweghị okwukwe. Ha chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Ha gwara ndị Izrel, sị: “Ọ bụrụ na ihe anyị dị Jehova mma, ọ ga-akpọba anyị n’ala ahụ ma nye anyị ya.”​—Ọnụ Ọgụ. 14:6-9.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị na-atụkwu egwu Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-atụkwu egwu Jehova, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ime ihe ga-adị Jehova mma n’ihe ọ bụla anyị na-ekpebi. (Ọma 16:8) Ka ị na-agụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ m ka ihe a mere, gịnị ka m gaara eme?’ Dị ka ihe atụ, were ya na i so ná ndị na-ege ntị ka ndị isi iri ndị ahụ na-agwa ụmụ Izrel ihe ndị ahụ na-adịghị mma. Ị̀ gaara ekwere ihe ndị ha kwuru tụwa ụjọ mmadụ, ka otú i si hụ Jehova n’anya nakwa otú i si chọọ ime ihe dị ya mma ọ̀ gaara eme ka ị ghara ikwere ihe ha kwuru? Ndị Izrel niile ahụ ekwetaghị na ihe Joshụa na Keleb na-agwa ha bụ eziokwu. Ihe a mere ka ohere ịba n’Ala Nkwa ahụ kwaa ha.​—Ọnụ Ọgụ. 14:10, 22, 23.

Ebe Joshụa na Keleb na-arịọ ndị Izrel iwe ji chọrọ ịtụ ha nkume. Ogidi ígwé ojii dị n’azụ ha.

Olee ndị ị gaara ekwere ihe ha kwuru? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Olee àgwà anyị kwesịrị ịgba mbọ mụta, n’ihi gịnịkwa?

8 Ịdị umeala n’obi. Ndị Jehova na-eme ka ha mata eziokwu ya bụ ndị dị umeala n’obi. (Mat. 11:25) Ịdị umeala n’obi mere ka anyị kwe ka e nyere anyị aka ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke. (Ọrụ 8:30, 31) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị mpako n’ihi na ọ ga-eme ka anyị were ya na echiche anyị bara uru ka ihe Baịbụl kwuru na ntụziaka si n’aka nzukọ Jehova.

9. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị ịdị umeala n’obi?

9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-adị umeala n’obi, anyị kwesịrị icheta na o nweghị ihe anyị bụ ma e jiri anyị tụnyere Jehova. (Ọma 8:3, 4) Anyị nwekwara ike ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ịdị umeala n’obi nakwa ka anyị na-ekwe ka a na-akụziri anyị ihe. Jehova ga-enyere anyị aka ka anyị na-ewere echiche ya nke ọ na-eji Okwu ya na nzukọ ya akụziri anyị kpọrọ ihe karịa ihe anyị chere. Ị gụwa Baịbụl, chọpụta ihe ndị na-egosi na Jehova hụrụ ndị dị umeala n’obi n’anya ma kpọọ ndị mpako na ndị onwe ha na-ebu isi asị. Kpacharakwa anya ka ị ghara ịkwụsị ịdị umeala n’obi ma e nye gị ọrụ mere ka i nwee ikike ma ọ bụkwanụ mee ka ị bụrụ onye a ma ama.

OTÚ ANYỊ GA-ESI JISIE EZIOKWU IKE

10. Olee ndị Jehova jirila duzie ndị ya ma nye ha ntụziaka?

10 Tụkwasị ntụziaka si ná nzukọ Jehova obi. N’oge ụmụ Izrel, Jehova ji Mosis, mechaakwa jiri Joshụa, na-enye ụmụ Izrel ntụziaka. (Josh. 1:16, 17) Jehova gọziri ndị Izrel mgbe ha weere ụmụ nwoke ndị a ka ndị na-anọchi anya ya. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst ọhụrụ, ọ bụ ndịozi iri na abụọ na-enye ntụziaka na ya. (Ọrụ 8:14, 15) Ndị okenye ndị ọzọ nọ na Jeruselem mechara soro ha. Mgbe ụmụnna nabatara ntụziaka si n’aka ụmụ nwoke ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, o mere ka “okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche sie ike, ha ana-ehikwu nne kwa ụbọchị.” (Ọrụ 16:4, 5) N’oge anyị a kwa, Jehova na-agọzi anyị ma anyị soro ntụziaka si n’aka nzukọ ya. Ma, olee otú obi ga-adị Jehova ma anyị jụ iwere ụmụ nwoke ndị a ka ndị ọ họpụtara o ji eduzi anyị? Anyị ga-amata azịza ajụjụ a ma anyị leba anya n’ihe mere mgbe e du ụmụ Izrel na-aga n’Ala Nkwa ahụ.

11. Gịnị mere ndị Izrel oge ochie ndị nupụụrụ Mosis isi, bụ́ onye Jehova họpụtara iduzi ndị ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 E nwere oge o ruru, mgbe ndị Izrel na-aga ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, ụfọdụ ndị a ma ama emegidewe Mosis, na-ekwu na ọ bụghị Jehova họpụtara ya idu ha. Ha sịrị: “Nzukọ a niile dị nsọ [ọ bụghị naanị Mosis], Jehova nọnyekwaara ha.” (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3) Ọ bụ eziokwu na n’anya Jehova, ‘nzukọ ahụ niile’ dị nsọ, ma Jehova họọrọ Mosis ka ọ na-edu ndị ya. (Ọnụ Ọgụ. 16:28) Mgbe ndị nnupụisi ahụ nọ na-akatọ Mosis, ọ bụ Jehova ka ha na-akatọ. Ihe ka ha mkpa abụghị ihe Jehova chọrọ, kama ọ bụ ihe hanwa chọrọ, ya bụ, inwetakwu ikike na ịbụ ndị a ma ama. Jehova gburu ndị isi ndị nnupụisi ahụ nakwa ọtụtụ puku ndị ọzọ sonyeere ha. (Ọnụ Ọgụ. 16:30-35, 41, 49) Taa, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova anaghị anabata ndị na-agba nzukọ ya ụkwụ.

Ebe Mosis na Erọn kwụ n’elu nkume, ndị Izrel iwe ji ana-eti mkpu na-atụ ha aka.

Olee ndị ị gaara akwado? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị nzukọ Jehova obi?

12 Anyị kwesịrị ịna-atụkwasị nzukọ Jehova obi. Mgbe ọ bụla o doro anya na e kwesịrị ịgbanwe otú anyị si ghọta eziokwu Baịbụl ma ọ bụkwanụ otú e si ahazi ọrụ Alaeze a na-arụ, ndị na-eduzi anyị anaghị egbu oge ịgbanwe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe. (Ilu 4:18) Ihe mere ha ji eme ya bụ na ihe kacha ha mkpa bụ ime Jehova obi ụtọ. Ha na-emekwa ike ha niile ka ihe ha na-ekpebi daba n’Okwu Chineke bụ́ eziokwu nke Jehova ji eduzi ndị ya niile.

13. Gịnị bụ ‘ụdị eziokwu a kụziiri anyị’? Gịnị ka anyị kwesịrị iji ya eme?

13 ‘Jidesie ụdị eziokwu a kụziiri anyị aka ike.’ (2 Tim. 1:13) ‘Ụdị eziokwu ahụ a kụziiri anyị’ bụ eziokwu ndị dị na Baịbụl Ndị Kraịst na-akụzi. (Jọn 17:17) Ọ bụ n’eziokwu ndị a ka ihe niile anyị kweere si. Nzukọ Jehova na-akụzikwara anyị ijidesi eziokwu aka ike. Anyị jidesie ya ike, Jehova ga-agọzi anyị.

14. Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst si hapụ ‘ụdị eziokwu a kụziiri ha’?

14 Gịnị nwere ike ime ma anyị hapụ ‘ụdị eziokwu ahụ a kụziiri anyị’? Legodị otu ihe atụ. N’oge ndịozi, e nwere asịrị a nọ na-akọsa. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na-ekwu na ụbọchị Jehova abịala. O nwere ike ịbụ akwụkwọ ozi ndị mmadụ chere na ọ bụ Pọl onyeozi dere kwuru ihe ahụ. Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ebughị ụzọ chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ha kweere asịrị ahụ, sorodị na-agbasa ya. A garaghị emegharị ha anya ma ọ bụrụ na ha chetara ihe Pọl kụziiri ha n’oge ya na ha nọ. (2 Tesa. 2:1-5) Pọl dụrụ ụmụnna ya ọdụ ka ha ghara ịna-ekwere ihe ọ bụla ha nụrụ. Iji nyekwara ha aka maka ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu, ihe Pọl ji mechie akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Tesalonaịka bụ: “Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede ekele a otú m na-eme n’akwụkwọ ozi ọ bụla ka ọ bụrụ ihe àmà; otú a ka m si ede ihe.”​—2 Tesa. 3:17.

15. Gịnị ka anyị ga-eme ka a ghara iji ụgha ndị yiri eziokwu megharịa anyị anya? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

15 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Pọl gwara ndị Tesalonaịka? Ọ bụrụ na anyị anụ ihe na-adabaghị n’eziokwu anyị mụtara na Baịbụl ma ọ bụkwanụ anyị anụ akụkọ wụrụ anyị akpata oyi, anyị kwesịrị ịkpachara anya. N’ebe bụ́bu Sọviet Yuniọn, e nwere mgbe ndị iro anyị nyere ụmụnna akwụkwọ ozi e kwuru na o si n’isi ụlọ ọrụ anyị. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ọ ga-adị mma ka ụfọdụ ụmụnna hiwe ọgbakọ nke ha nke ga-adị iche ná nzukọ Jehova. Akwụkwọ ozi ahụ yiri ihe si n’aka nzukọ Jehova n’eziokwu. Ma, a ghọgbughị ụmụnna ji obi ha niile na-efe Jehova. Ha ghọtara na ihe akwụkwọ ozi ahụ na-ekwu adabaghị n’ihe a kụziiri ha. Taa, mgbe ụfọdụ, ndị iro anyị nwere ike iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ gbalịa imegharị anyị anya nakwa ikewa anyị. Kama ‘ikwe ka e megharịa anyị anya,’ anyị nwere ike ichebe onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị echee ma ihe anyị nụrụ ma ọ bụ ihe anyị gụrụ ọ̀ dabara n’eziokwu anyị mabu.​—2 Tesa. 2:2; 1 Jọn 4:1.

Foto ndị na-egosi: 1. Ọtụtụ afọ gara aga, ebe ụmụnna gbakọrọ n’otu ụlọ, otu nwanna ana-egosi ha akwụkwọ ozi e ji aha “Watch Tower” dee. 2. N’oge anyị a, ebe ụmụnna gara nnọkọ oriri, otu nwanna ana-egosi ha vidio dị n’Ịntanet gbasara Ndịàmà Jehova.

Ekwela ka e jiri ụgha ndị yiri eziokwu megharịa gị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)a


16. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 16:17, 18, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ụfọdụ ndị hapụ eziokwu?

16 Gị na ndị ji obi ha niile na-efe Jehova dịrị n’otu. Jehova chọrọ ka anyị dịrị n’otu na-efe ya. Anyị ga-adị n’otu ma ọ bụrụhaala na anyị ejisie eziokwu aka ike. Onye ọ bụla hapụrụ eziokwu na-akpata nkewa n’ọgbakọ. N’ihi ya, Chineke chọrọ ka anyị ‘zere ha.’ Ma ọ́ bụghị ya, e nwere ike ime ka anyịnwa hapụ eziokwu.​—Gụọ Ndị Rom 16:17, 18.

17. Olee uru ọ na-abara anyị ma anyị chọpụta eziokwu ma jisie ya aka ike?

17 Anyị chọpụta nke bụ́ eziokwu ma jisie ya aka ike, e nweghị ihe ga-eme adịm ná mma anyị na Jehova. Okwukwe anyị ga-esikwu ike. (Efe. 4:15, 16) A ga-echebe anyị ka Ekwensu ghara iji ozizi ụgha ya na aghụghọ ya megharịa anyị anya. Anyị ga-anọkwa n’aka Jehova n’oge oké mkpagbu. Jisie eziokwu aka ike, ‘Chineke nke udo ga-anọnyekwara gị.’​—Fil. 4:8, 9.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị chọpụta nke bụ́ eziokwu?

  • Olee otú ịtụ egwu Jehova na ịdị umeala n’obi si enyere anyị aka ịchọpụta eziokwu ma soro ya?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ijisi eziokwu aka ike?

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

a NKỌWA FOTO: Foto a na-egosi ihe mere ọtụtụ afọ gara aga, ebe ụmụnna nọ n’ebe bụ́bu Sọviet Yuniọn nwetara akwụkwọ ozi yiri nke si n’isi ụlọ ọrụ anyị. Ma o si n’aka ndị iro anyị. N’oge anyị a, ndị iro anyị nwere ike iji Ịntanet na-agbasa akụkọ na-abụghị eziokwu gbasara nzukọ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya